Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 21:8 - Bible Nso

8 Ha we si, Ònye bu onye ahu n'etiti ebo Israel nile nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa? Ma, le, ọ dighi nwoke si na Jebesh-gilead bata n'ọmuma-ulo-ikwū rue nkpọkọta ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Mgbe ahụ, ha jụrụ ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-esoghị anyị zukọta mgbe anyị zukọtara nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa?” Ha chọpụtara na o nweghị onye ọbụla si na Jebesh Gilead bịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 21:8
9 Iomraidhean Croise  

Jebesh-gilead nile we nu ihe nile ndi Filistia mere Sọl,


Gini ka ayi gēmere ha, bú ndi fọduru, inye ha nwunye, ebe ayi onwe-ayi were Jehova ṅua iyi na ayi agaghi-enye ha nime umu-ayi ndinyom na nwunye?


Ndi Israel we gukọta onwe-ha, ma, le, ọ dighi nwoke sitere na ndi bi na Jebesh-gilead nọ n'ebe ahu.


Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri, Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku; N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka, Iyere Jehova aka imegide ndi-dike.


O we chiri ehi abua, bọkasia ha, zisa ha n'ókè-ala nile nke Israel n'aka ndi-ozi, si, Onye ọ bula nke nāputaghi iso Sọl na iso Samuel n'azu, otú a ka agēme ehi-ya. Oké egwu nke Jehova we dakwasi ndi Israel, ha we puta dika otù nwoke.


Ha we si ndi-ozi biara, Otú a ka unu gāsi ndikom Jebesh-gilead, Echi ka nzọputa gādiri unu, mb͕e anyanwu nēkpo ọku. Ndi-ozi ahu we bia gosi ndikom Jebesh; ha we ṅuria ọṅu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan