Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 21:5 - Bible Nso

5 Umu Israel we si, Ònye nọ n'etiti ebo nile nke Israel nke nārigokuteghi Jehova nime nkpọkọta? N'ihi na ọṅuǹu-iyi uku di bayere onye ahu nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa, si, Aghaghi ime ka ọ nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Emesịa, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-enweghị onye nọchiri anya ha nʼihu Onyenwe anyị anyị mgbe anyị zukọrọ na Mizpa?” Nʼihi na ha ṅụrụ iyi kwuo na onye ọbụla jụrụ ịbịa nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa aghaghị ịnwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 21:5
8 Iomraidhean Croise  

Onye anābu ọnu ka onye nke ji aghughọ eje ozi Jehova bu, onye anābu ọnu ka onye nke nēb͕opu mma-agha-ya n'ọbara bu kwa.


Ma ndikom Israel ṅuru iyi na Mizpa, si, Ọ dighi nwoke ọ bula nime ayi gēnye Benjamin nwa-ya nwayi na nwunye.


Ma ayi onwe-ayi apughi inye ha nwunye sitere n'umu-ayi ndinyom: n'ihi na umu Israel ṅuru iyi, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēnye Benjamin nwunye.


Umu Israel we cheghari uche bayere Benjamin, bú nwa-nne-ha, si, Ebipuru otù ebo n'Israel ta.


Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri, Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku; N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka, Iyere Jehova aka imegide ndi-dike.


O we chiri ehi abua, bọkasia ha, zisa ha n'ókè-ala nile nke Israel n'aka ndi-ozi, si, Onye ọ bula nke nāputaghi iso Sọl na iso Samuel n'azu, otú a ka agēme ehi-ya. Oké egwu nke Jehova we dakwasi ndi Israel, ha we puta dika otù nwoke.


Ma achiri ndikom Israel n'ihe-ike ubọchi ahu: Sọl we b͕a ndi Israel iyi, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri rue anyasi, ru kwa mb͕e m'bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom. Ndi Israel nile we ghara idetu nri ọnu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan