Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 21:22 - Bible Nso

22 O gēru kwa, mb͕e ndi bu nna-ha ma-ọbu umu-nne-ha biara ichọ ayi okwu, na ayi gāsi ha, Nyenu ayi ha n'amara: n'ihi na ayi anwudeghi nye nwoke ọ bula nwùnye-ya n'agha: ma unu onwe-unu eweghi ha nye ha; ma ọ bughi otú a, ikpe gāma unu ub͕u a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ọ bụrụ na nna ha maọbụ ụmụnne ha abịakwute anyị ịjụ ajụjụ banyere ha, anyị ga-agwa ha okwu sị, ‘Biko, gosinụ anyị amara, site nʼịhapụ ha ka ha lụọ ụmụ agbọghọ ahụ, nʼihi na anyị achọtaghị ụmụ agbọghọ ga-ezuru ha niile mgbe anyị gburu ndị niile bi na Jebesh Gilead. O nwekwaghị ụzọ ọzọ unu gaara esi nye ha ụmụ unu ndị nwanyị ghara ịbụ ndị ikpe mara.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 21:22
10 Iomraidhean Croise  

Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha.


N'otù ubọchi ahu ka Noa, na Shem na Ham na Jefet, bú umu-ndikom Noa, na nwunye Noa, ha na nwunye nile nke umu-ya ndikom, bara n'ub͕ọ ahu;


Ọnyà mara madu ma ọ buru na o were ọsọsọ si, Ọ di nsọ, Ma mb͕e ọ kwesiri nkwa o we ju ajuju.


Ma, n'ihi ikwa-iko nile, ka nwoke ọ bula nwe nwunye nke aka ya, ka nwanyi ọ bula nwe kwa di nke aka ya.


Ma ndikom Israel ṅuru iyi na Mizpa, si, Ọ dighi nwoke ọ bula nime ayi gēnye Benjamin nwa-ya nwayi na nwunye.


Benjamin we lata na mb͕e ahu; ha we nye ha ndinyom ahu ndi ha mere ka ha di ndu site na ndinyom Jebesh-gilead: ma ha achọtaghi nwunye gēzuru ha nile otú a.


Ma ayi onwe-ayi apughi inye ha nwunye sitere n'umu-ayi ndinyom: n'ihi na umu Israel ṅuru iyi, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēnye Benjamin nwunye.


Gini ka ayi gēmere ha, bú ndi fọduru, inye ha nwunye, ebe ayi onwe-ayi were Jehova ṅua iyi na ayi agaghi-enye ha nime umu-ayi ndinyom na nwunye?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan