Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 21:14 - Bible Nso

14 Benjamin we lata na mb͕e ahu; ha we nye ha ndinyom ahu ndi ha mere ka ha di ndu site na ndinyom Jebesh-gilead: ma ha achọtaghi nwunye gēzuru ha nile otú a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Mgbe ndị Benjamin lọghachiri, e dunyere ha narị ndị inyom anọ, ndị Jebesh Gilead, bụ ndị e mere ka ha dị ndụ. Ma ụmụ agbọghọ ndị a ezughị ọnụọgụgụ ha niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 21:14
7 Iomraidhean Croise  

Ma, n'ihi ikwa-iko nile, ka nwoke ọ bula nwe nwunye nke aka ya, ka nwanyi ọ bula nwe kwa di nke aka ya.


Ma nnù ndikom na ọgu iri chighariri b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon, nọdu na nkume di elu, bú Rimon, ọnwa anọ.


Ha we chọta n'etiti ndi bi na Jebesh-gilead nnù umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke site na ndina nwoke: ha we me ka ha biarue ọmuma-ulo-ikwū rue Shailo nke di n'ala Kenean.


Nzukọ Israel nile we ziga, gwa umu Benjamin okwu, bú ndi nọ na nkume di elu, bú Rimon, we kpọ ha òkù udo.


Ndi Israel we cheghari uche bayere Benjamin, n'ihi na Jehova emewo ntiwa n'ebo Israel nile.


O gēru kwa, mb͕e ndi bu nna-ha ma-ọbu umu-nne-ha biara ichọ ayi okwu, na ayi gāsi ha, Nyenu ayi ha n'amara: n'ihi na ayi anwudeghi nye nwoke ọ bula nwùnye-ya n'agha: ma unu onwe-unu eweghi ha nye ha; ma ọ bughi otú a, ikpe gāma unu ub͕u a.


Ha we si, Ònye bu onye ahu n'etiti ebo Israel nile nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa? Ma, le, ọ dighi nwoke si na Jebesh-gilead bata n'ọmuma-ulo-ikwū rue nkpọkọta ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan