Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 20:6 - Bible Nso

6 M'we jide ikom nwayi, bọ̀ ya abọ̀, zisa ya n'ọhia nile nke ala-nketa Israel: n'ihi na ha emewo ihe-nzube ọjọ na ihe-nzuzu n'Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Nʼihi ya, abọwasịrị m ahụ iko m nwanyị ụzọ iri na abụọ, zisa ya nʼakụkụ niile nke ihe nketa ndị Izrel niile nʼihi na ndị ikom Gibea ndị ahụ emeela ihe ọjọọ na ihe ihere nʼala Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 20:6
9 Iomraidhean Croise  

Umu-ndikom Jekob we si n'ọhia bata mb͕e ha nuru ya: ọ nēwuta ndikom ahu, ha nēwe iwe di ọku nke-uku, n'ihi na ọ bu ihe-nzuzu ka o mere n'Israel, n'idinayere nwa-nwayi Jekob; nke nēkwesighi ime otú a.


Unu ewerela ihe ndia nile meru onwe-unu: n'ihi na ewere ihe ndia nile me ka mb͕a nile rua árú, bú ndi Mu onwem nāchupu n'iru unu:


Unu gēdebe kwa ihe-ndebem, ka unu we ghara ime ihe ọ bula nime ukpuru ihe-árú ndia, nke anēmeri n'iru unu, ka unu we ghara kwa iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ọ gēru kwa, na onye anwudere ya na ihe ahu ewezugara nye Jehova, agēsure ya n'ọku, ya onwe-ya na ihe nile o nwere: n'ihi na ọ gabigawo ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na n'ihi na o mewo ihe-nzuzu n'Israel.


Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n'ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n'ulo-gi, ka ayi we mara ya.


Nwoke ahu, bú onye-nwe ulo, we pukuru ha, si ha, É-è, umu-nnem, biko, unu emela ihe ọjọ; ebe nwoke a bataworo n'ulom, unu emela ihe-nzuzu a.


O we ba n'ulo-ya, were mma, jide iko-ya nwayi, bọ̀ ya, dika ọkpukpu-ya nile si di, n'ọbubọ̀ iri na abua, we zisa ya n'ókè-ala nile nke Israel.


ayi gēwere kwa ndikom iri nime ọgu ise nke ebo nile nke Israel, na ọgu ise nime nnù abua na ọgu iri, na nnù abua na ọgu iri nime orú nnù na nnù ise, iwetara ndi Israel ihe-oriri-uzọ, ka ha we me, mb͕e ha biaruru Geba Benjamin, dika ihe-nzuzu nile si di nke ha meworo n'Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan