Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 20:5 - Bible Nso

5 Ndi-nwe Gibea we bilie megidem, b͕a ulo buruburu imegidem n'abali; mu ka ha chère ib͕u, ikom nwayi ka ha weda-kwa-ra n'ala, o we nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Nʼoge abalị, ndị ikom Gibea bịara gba ụlọ anyị nọ nʼime ya gburugburu. Nzube ha bụ igbu m. Ma ha jidere iko m nwanyị, dinakwuru ya nʼike, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 20:5
10 Iomraidhean Croise  

Unu ewerela ihe ndia nile meru onwe-unu: n'ihi na ewere ihe ndia nile me ka mb͕a nile rua árú, bú ndi Mu onwem nāchupu n'iru unu:


ha gēme kwa ka nwa-ab͕ọghọ ahu putarue ọnu-uzọ ulo nna-ya, ndikom obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya ka ọ we nwua: n'ihi na o mere ihe-nzuzu n'Israel, ikwa iko n'ulo nna-ya: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


unu gēme kwa ka ha abua putarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, unu gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha we nwua; nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o tighi nkpu n'obodo: na nwoke ahu, n'ihi na o wedawo nwunye madu-ibe-ya n'ala: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


Ọ gēru kwa, na onye anwudere ya na ihe ahu ewezugara nye Jehova, agēsure ya n'ọku, ya onwe-ya na ihe nile o nwere: n'ihi na ọ gabigawo ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na n'ihi na o mewo ihe-nzuzu n'Israel.


Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n'ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n'ulo-gi, ka ayi we mara ya.


Ọ si ya, Bilie, ka ayi la; ma ọ dighi onye nāza: o we būru ya n'elu inyinya-ibu-ya; nwoke ahu we bilie, je rue ebe nke ya.


Nwoke ahu, bú onye Livai, di nwayi ahu nke eb͕uru eb͕u, we za, si, Ọ bu Gibea nke diri Benjamin ka m'biara, mu onwem na ikom nwayi, inọ ọnọdu-abali.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan