Jehova we tib͕ue Benjamin n'iru Israel: umu Israel we bibie orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri-na-ise nime Benjamin ubọchi ahu: ndia nile nāmiputa mma-agha.
Ha we chigharia b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon: ha we ghọrọ ha, bú nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, n'uzọ atuliri atuli, we sogidesi ha ike rue Gidom, tib͕ue nime ha nnù ndikom ise.