Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 20:40 - Bible Nso

40 Nkwuli anwuru ahu we malite isi n'obodo ahu rigo, buru ogidi anwuru-ọku, Benjamin we gha anya n'azu ha, ma, le, obodo ahu dum rigoro n'anwuru-ọku rue elu-igwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

40 Ma mgbe anwụrụ ọkụ malitere ịla elu site nʼobodo ahụ, ndị Benjamin lere anya nʼazụ hụ ka anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼakụkụ niile nke obodo ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 20:40
6 Iomraidhean Croise  

ọ le anya n'ebe Sọdọm na Gọmọra di, na n'ebe ala nile nke Buruburu-ala ahu di, ọ we hu, ma, le, anwuru-ọku nke ala ahu rigoro dika anwuru-ọku nke oké ọku.


Ọnye bu nka nke nēsi n'ọzara arigota dika ogidi di iche iche nke anwuru-ọku, Nke anēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bú myrrh na frankincense, Site n'ihe nile egwere egwe nke onye-ahia?


M'gēnye kwa ihe-ebube di iche iche n'elu-igwe na n'uwa: ọbara, na ọku, na ogidi nke anwuru-ọku.


Ndikom Ai we le anya n'azu ha, hu, ma, le, anwuru-ọku obodo-ha rigoro rue elu-igwe, ike adighi kwa nime ha ib͕alaga otù uzọ ọzọ: ndi Israel ndi nāb͕alaga n'ọzara we chigharia imegide ndi nāchu ha.


Nke mere ya abua ha we si, Haleluya. Anwuru-ọku-ya nārigo elu rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Ma, le, otù agadi nwoke siri n'ọlu-ya, bú n'ubi, bia n'anyasi; ma nwoke ahu sitere n'ugwu Efraim, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa na Gibea: ma ndikom ebe ahu bu ndi Benjamin.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan