Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 20:34 - Bible Nso

34 Orú nnù ndikom na nnù ise ndi arọputara arọputa n'Israel nile we bia na ncherita-iru Gibea, agha ahu we di arọ́: ma ndi Benjamin amaghi na ihe ọjọ nēmetu ha aru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Iri puku ndị ikom Izrel ahụ zuruoke gara na ncherita ihu Gibea busoo ya agha. Agha ahụ dị ike nke ukwuu nke mere na ndị Benjamin amataghị na oke mbibi na-abịakwasị ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 20:34
12 Iomraidhean Croise  

Ha nāla ubọchi nile ha n'iyì n'ọdi-nma, Ma n'otù ntabi-anya ha nārida n'ala-mọ.


Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di: Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.


Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri: Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ.


N'ihi na ọbuná madu adighi-ama mb͕e-ya: dika azù nke anānwude n'ub͕u ọjọ, na dika umu nnunu nke nāma n'ọnyà, dika ndia ka umu madu nāma n'ọnyà na mb͕e ọjọ, mb͕e ọ nādakwasi ha na mberede.


Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.


N'ihi nka unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.


Ma nēzenu onwe-unu, ka aghara iwere imebiga-ajọ-ihe-ókè, na iṅubiga-manya-ókè, na ncheb͕u nke ndu a, bob͕u obi-unu ma eleghi anya, ubọchi ahu we biakwasi unu na mberede dika ọnyà;


Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.


O rue, mb͕e eze Ai huru nke ahu, na ndikom obodo-ya mere ngwa, bilie n'isi-ututu, pua izute Israel ibu agha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, na mb͕e akara àkà, n'iru Araba ahu; ma ya onwe-ya amaghi na ndi nēru nbì di megide ya n'azu obodo-ya.


Jehova we tib͕ue Benjamin n'iru Israel: umu Israel we bibie orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri-na-ise nime Benjamin ubọchi ahu: ndia nile nāmiputa mma-agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan