i gēme kwa Ai, me kwa eze-ya, dika i mere Jeriko, me kwa eze-ya: nání, na unu gālutara onwe-unu n'agha ihe-nkwata-ya, na anu-ulo-ya: doro onwe-gi ndi nēru nbì megide obodo ahu n'azu ya.
O we nye ha iwu, si, Lenu, unu onwe-unu nēru nbì megide obodo ahu, n'azu obodo: unu esila n'obodo ahu je n'ebe di anya nke-uku, buru-kwa-nu ndi nọ na njikere, unu nile:
Orú nnù ndikom na nnù ise ndi arọputara arọputa n'Israel nile we bia na ncherita-iru Gibea, agha ahu we di arọ́: ma ndi Benjamin amaghi na ihe ọjọ nēmetu ha aru.