Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 20:28 - Bible Nso

28 Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, nēguzo kwa n'iru ya na mb͕e ahu,) si, M'gapu kwa ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha, ma-ọbu #m'gāgha? Jehova we si, Rigonu; n'ihi na echi ka M'gēnye ya n'aka-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Finehaz nwa Elieza, nwa nwa Erọn na-eje ozi nchụaja nʼebe ahụ.) Ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị ase sị ya, “Ọ bụ anyị gaakwa ọzọ ibuso ụmụnna anyị ndị Benjamin agha, ka ị sị anyị agala?” Onyenwe anyị zara sị ha, “Gaanụ, nʼihi na aga m ahụ na unu meriri ndị agha Benjamin echi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 20:28
21 Iomraidhean Croise  

Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n'ulo Abinadab nke di n'ugwu ntà: Uza na Ahio, bú umu Abinadab, we nēdu ub͕ọ-ala ọhu ahu.


Ọ bughi unu gēnwe ibu agha n'agha nka: guzonu onwe-unu, guzo, hu nzọputa Jehova n'etiti unu, Juda na Jerusalem: unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ: echi pukurunu ha; Jehova nọye-kwa-ra unu.


nwa Abishua, nwa Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-isi-nchu-àjà:


Eleeza nwa Eron we lutara onwe-ya otù nime umu-ndinyom Putiel, ọ we muara ya Finehas. Ndia bu ndi-isi nke ndi bu nna nke ndi Livai, dika ab͕uru nile ha si di.


Jehova, amawom na ọ bughi n'aka ya onwe-ya ka uzọ madu di: ọ bughi onye ọ bula nke nēje ije nwe ime ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.


Na mb͕e ahu ka Jehova kewaputara ebo Livai, ibū ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iguzo n'iru Jehova ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue ta.


N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, arọputawo ya n'ebo-gi nile, iguzo ije ozi n'aha Jehova, ya onwe-ya na umu-ya ndikom ubọchi-gi nile.


Umu Israel we ziga Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ijekuru umu Reuben, na ijekuru umu Gad, na ijekuru nkera ebo Manase, rue ala Gilead;


Eleeza nwa Eron we nwua; ha we lìe ya n'ugwu Finehas nwa-ya, nke enyere ya n'ugwu Efraim.


Joshua we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova, n'ìhi gini ka I meworo ka ndi nka gabiga Jọdan ma-ọli, inye ayi n'aka ndi-Amorait, ime ka ayi la n'iyì? ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi kwere we biri n'ofè Jọdan!


Jehova we si, Juda gārigo: le, enyewom ala nka n'aka-ya.


Ma, le, otù agadi nwoke siri n'ọlu-ya, bú n'ubi, bia n'anyasi; ma nwoke ahu sitere n'ugwu Efraim, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa na Gibea: ma ndikom ebe ahu bu ndi Benjamin.


O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Bilie, rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na enyewom ya n'aka-gi.


Sọl we jua Jehova ase, si, M'gārida sochie ndi Filistia n'azu? Ì gēnye ha n'aka Israel? Ma Ọ zaghi ya n'ubọchi ahu.


Devid we jua Jehova ase, si, Ọ buru na achuam usu a ndi nāpunara madu ihe n'azu, #m'gēru ha aru? Ọ si ya, Chua: n'ihi na i ghaghi iru ha aru, i ghaghi kwa inaputa ha ihe nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan