Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 20:2 - Bible Nso

2 Ndi-isi ndi Israel nile, bú ebo nile nke Israel, we guzo onwe-ha nime nkpọkọta ndi Chineke, orú nnù ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndi ji ukwu eje, ndi nāmiputa mma-agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ndị ndu ebo Izrel niile weere ọnọdụ na nzukọ nke ndị Chineke, ọnụọgụgụ ha bụ narị puku ndị agha anọ, ndị na-ebu mma agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 20:2
9 Iomraidhean Croise  

Nwayi ahu we si, Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i chère ihe di otú a megide ndi Chineke? n'ihi na eze nēkwu okwu a dika onye ikpe mara, ebe eze nādighi-eme ka onye nke ya achupuru achupu lata.


Joab we nye eze ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel: ma orú nnù ndikom ọgu uzọ ise di n'Israel, ndi bu dìnkpà ndi nāmiputa mma-agha; ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri.


Eze Moab we hu na agha ahu di ike kari ya, o we chiri nnù ndikom na ọgu iri-na-ise tiyere onwe-ya, bú ndi nāmiputa mma-agha, itiwaru eze Edom:


Mb͕e umu Israel nuru ya, nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha nime Shailo, irigokuru ha ibu agha.


Umu Benjamin we gukọta onwe-ha n'ubọchi ahu site n'obodo nile ha, orú nnù uzọ atọ na nnù ise, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi ndi bi na Gibea, ndi gukọtara onwe-ha, nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa.


Ma ndikom Israel gukọtara onwe-ha, orú ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi Benjamin: ndia nile bu ndikom agha.


(Ma umu Benjamin nuru na umu Israel arigowo rue Mizpa.) Umu Israel we si, Kwuenu, ìhe ọjọ a si aṅa di?


Ma Zeba na Zalmuna nọ nime Kakoa, ha na ọmuma-ulo-ikwū nile ha, ihe ra ka orú nnù ndikom, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri, ndi fọduru site n'ọmuma-ulo-ikwū nile nke umu Iru-anyanwu: ma ndi daworo di orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.


O we gukọta ha na Bezek; umu Israel we di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa, na nnù iri, ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom uzọ atọ, na nnù iri-na-ise.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan