Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 20:1 - Bible Nso

1 Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ahụ, ndị Izrel niile ndị si nʼala Dan ruo Bịasheba, tinyere ndị si nʼala Gilead, pụtara dịka otu mmadụ, bịa zukọọ nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 20:1
35 Iomraidhean Croise  

O we me ka obi ndikom nile nke Juda rulata, dika otù nwoke; ha we zigara eze ozi, si, Lata, gi onwe-gi na ndi-orù-gi nile.


o we me ya eze Gilead, na nke ndi-Ashurait, na nke Jezreel, na nke Efraim, na nke Benjamin, na nke Israel nile.


Eze we si Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, nke di n'aka-ya, Biko, jegharia n'ebo nile nke Israel, site na Dan we rue Bia-sheba, gukọtanu ndi Israel, ka m'we mara ọnu-ọgugu ndi Israel.


ime ka ala-eze si n'ulo Sọl gabiga, na ime ka oche-eze Devid guzosie ike n'elu Israel na n'elu Juda, site na Dan we rue na Bia-sheba.


Ma, le, m'nāsi na m'gēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, dika Jehova gwara Devid, bú nnam, okwu, si, Nwa-gi, onye M'gētiyekwasi n'oche-eze-gi n'ọnọdu gi, ya onwe-ya gēwuru aham ulo.


Ndi-isi nile nke usu-ndi-agha nile, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia onye-nlekọta, ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan nwa Karca, na Seraia nwa Tanhumet onye Netofa, na Jaazanaia nwa onye Meakat, ha onwe-ha na ndikom-ha.


Devid we si Joab, si kwa ndi-isi ndi Israel, Jenu, gua Israel ọnu site na Bia-sheba we rue Dan; wetaranum ọnu-ọgugu-ha ka m'we mara ya.


Ha we guzo okwu a, ikwusa n'Israel nile, site na Bia-sheba we rue Dan, ka ha bia imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga nime Jerusalem: n'ihi na ha emeghi ya dika edeworo ya n'akwukwọ n'ọtutu mb͕e gara aga.


Ọnwa nke-asa we rue, umu Israel nọ kwa n'obodo nile ha, ndi ahu we chikọta onwe-ha dika otù onye rue Jerusalem.


na nime Haza-shual, na nime Bia-sheba na umu-obodo-ya;


Ndi ahu nile we chikọta onwe-ha dika otù onye rue amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri; ha we si Ezra, bú ode-akwukwọ, ka o weta akwukwọ iwu Moses, nke Jehova nyere Israel n'iwu.


Jeremaia we biakute Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa, ya na ya we biri n'etiti ndi Israel ndi fọduru n'ala-ha.


Ma umu Reuben na umu Gad nwere ọtutu anu-ulo, ha riri nne nke-uku: ha we hu ala Jeza, na ala Gilead, ma, le, ebe ahu bu ebe anu-ulo;


Moses we were Gilead nye Makia nwa Manase; ọ we biri nime ya.


na Dilan, na Mizpe, na Jọkteel;


Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.


na Mizpeh, na Kefira, na Moza;


Mb͕e umu Israel nuru ya, nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha nime Shailo, irigokuru ha ibu agha.


Umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we laghachi, si n'ebe umu Israel nọ site na Shailo, nke di n'ala Kenean, ga, ijeru ala Gilead, iru ala ihe-onwunwe-ha, nke ha nwere ihe-onwunwe nime ya, dika okwu-ọnu Jehova n'aka Moses si di.


dika orú nnù uzọ ise, ndi ejikere nke usu-ndi-agha, gabigara n'iru Jehova ibu agha, rue ala ihe nādighi nke Jeriko.


Umu Amon we kpọkọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Gilead. Umu Israel we chikọta onwe-ha, ma ulo-ikwū-ha na Mizpa.


Jefta we jeso ndi-okenye Gilead, ndi ahu we mee ya onye-isi na onye-ọchi-agha ichi ha: Jefta we kwue okwu-ya nile n'iru Jehova nime Mizpa.


Jefta we bia Mizpa rue ulo-ya, ma, le, nwa-ya nwayi chiri egwú-otiti na ite-egwú nāputa izute ya: ma nání nwata ahu bu otù nwa o nwere; ọ dighi nwa-nwoke ma-ọbu nwa-nwayi o nwere ma-ọbughi nání ya.


Ha we kpọ aha obodo ahu Dan, n'aha Dan, bú nna-ha, onye amuru nye Israel: otù ọ di, Laish bu aha obodo ahu na mbu.


Ndikom nile nke Israel we chikọta onwe-ha imegide obodo ahu, dika otù nwoke ka ejikọtara ha n'otù.


Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.


Ndi-isi ndi Israel nile, bú ebo nile nke Israel, we guzo onwe-ha nime nkpọkọta ndi Chineke, orú nnù ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndi ji ukwu eje, ndi nāmiputa mma-agha.


Umu Israel nile, na ndi ahu nile, we rigo, biarue Bet-el, kwa ákwá, nọdu n'ebe ahu n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu rue anyasi; ha we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova.


Ndi Israel nile we bilie dika otù nwoke, si, Ayi agaghi-eje, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, ayi agaghi-ewezuga kwa onwe-ayi, onye ọ bula ibà n'ulo-ya.


Umu Israel we si, Ònye nọ n'etiti ebo nile nke Israel nke nārigokuteghi Jehova nime nkpọkọta? N'ihi na ọṅuǹu-iyi uku di bayere onye ahu nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa, si, Aghaghi ime ka ọ nwua.


Samuel we kpọkọta ndi Israel ibiakute Jehova rue Mizpa;


Israel nile site na Dan we rue Bia-sheba we mara na emewo Samuel onye kwesiri okwukwe iburu Jehova onye-amuma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan