Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 2:21 - Bible Nso

21 Mu onwem agaghi-anapu kwa onye ọ bula ala-ya n'iru ha ọzọ site na mba nile ndi Joshua rapuru mb͕e ọ nwuru:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 agaghị m achụpụkwa site nʼihu ha mba ndị ahụ Joshua hapụrụ mgbe ọ nwụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 2:21
8 Iomraidhean Croise  

n'ihi na ha emeghi ihem nile ekpere n'ikpe, ọ bu kwa ukpurum nile ka ha juru, ubọchi-izu-ikem nile ka ha me-kwa-ra ka ha ghara idi nsọ, ọ bu kwa n'iso arusi nile nke ndi bu nna-ha ka anya-ha di.


maranu nke-ọma na Jehova, bú Chineke-unu, agaghi-anapu kwa mba ndia ala-ha ọzọ n'iru unu, kama ha gāburu unu ib͕udu na ọnyà, na utari n'akuku-aru-unu, na ogwu n'anya-unu, rue mb͕e unu gālapu n'iyì n'ezi ala nka, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu.


Lenu, emewom ka mba ndia nke fọduru dayere unu n'ihe-nketa diri ebo nile unu, site na Jọdan, ha na mba ahu nile ndi m'bipuworo, we rue oké osimiri uku ahu n'ọdida anyanwu.


Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya gākwapu kwa ha n'iru unu, napu kwa ha ala-ha n'iru unu; unu gēnweta kwa ala-ha, dika Jehova, bú Chineke-unu, gwara unu okwu.


O rue, mb͕e ọnwu Joshua gasiri, na umu Israel juru Jehova ase, si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi imegide ndi Kenean, ibuso ha agha?


M'we si kwa, M'gaghi-achupu ha n'iru unu; kama ha gāburu unu ogwu n'akuku-aru-unu, chi nile ha gābu-kwa-ra unu ọnyà.


Ma ndia bu mba ndi Jehova rapuru, iji ha nwa Israel, bú ndi nile nāmaghi agha nile nke Kenean;


bú ndi-isi ise nke ndi Filistia, na ndi Kenean nile, na ndi Zaidon, na ndi-Haivait ndi bi n'ugwu Lebanon, site n'ugwu Beal-heamon rue nbata Hemat.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan