Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 2:17 - Bible Nso

17 Ọzọ kwa, ha egeghi nti ndi-ikpé-ha, n'ihi na ha soro chi ọzọ nākwa iko, we kpọ isi ala nye ha: ha siri n'uzọ ahu wezuga onwe-ha ngwa, bú nke ndi bu nna-ha jere nime ya, n'inu ihe nile Jehova nyere n'iwu; ma ha emeghi otú a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ma ụmụ Izrel egeghị ndị ikpe ahụ ntị, kama ha nọgidere na-akpọ isiala nye ma na-agbasokwa chi ndị ọzọ. Dịka nna nna ha na-emeghị, ha mere ngwangwa wezuga onwe ha site nʼụzọ Onyenwe anyị, bụrụ ndị na-enupu isi nʼebe iwu Onyenwe anyị dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 2:17
25 Iomraidhean Croise  

Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú, Ha we nākwa iko n'omume nile ha.


Ọtutu mb͕e ka Ọ nanaputa ha; Ma ha onwe-ha nānupu isi n'okpuru Chineke na ndum-ọdu-ha, Ewe kwada ha n'ajọ omume-ha.


N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì: I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko.


ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa: ha eme-woro onwe-ha nwa-ehi akpuru akpu, ha we kpọ isi ala nye ya, chu-kwa-ra ya àjà, si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.


Jehova we sim n'ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n'ebe ahu.


Otú a ka Jehova siri, Guzonu n'uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya.


Unu na nne-unu kpe ikpe, kpenu; n'ihi na ya onwe-ya abughi nwunyem, Mu onwem abughi kwa di-ya: ya wezuga ikwa-iko-ya nile n'iru ya, ya wezuga kwa ikwa-iko nile nke nwanyi nwere di ọ nākwa n'etiti ara-ya abua;


Ha agaghi-achu-kwa-ra nkpi àjà-ha ọzọ, nke ha onwe-ha so nākwa iko. Ukpuru ebighi-ebi ka nka gāburu ha rue ọb͕ọ-ha nile.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Juda, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha juworo iwu Jehova, ọ bu kwa ukpuru-Ya nile ka ha nēdebeghi, okwu-ugha-ha nile, nke ndi bu nna-ha jeroso, we dufue ha:


Ọ nējum anya na unu nēsi n'aka Onye kpọrọ unu n'amara Kraist b͕abiga ọsọsọ otú a n'ozi ọma di iche;


Jehova we si Moses, Le, gi na nna-gi-hà ganēdina; ndi nka gēbili kwa, soro chi ala ọzọ nile nke ala ahu kwa iko, bú ebe ha onwe-ha nābà n'etiti ya, ha gārapukwam, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum nke Mu nà ha b͕ara.


Mu onwem aghaghi kwa izo irum n'ubọchi ahu n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo, n'ihi na ha echewo chi di iche iche ọzọ iru.


Jehova we sim, Bilie, si n'ebe a rida ngwa ngwa; n'ihi na ndi-gi, nke i meworo ka ha si n'Ijipt puta, ebibiwo onwe-ha; ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa; ha emeworo onwe-ha nwa-ehi awuru awu.


M'we hu, ma, le, unu emehiewo megide Jehova, bú Chineke-unu; unu emeworo onwe-unu nwa-ehi awuru awu: unu esiwo n'uzọ nke Jehova nyere unu n'iwu wezuga onwe-unu ngwa ngwa.


Ndi Israel we si Joshua, Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēfè òfùfè, olu-Ya ka ayi gēge kwa nti.


Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi ma-kwa-ra omume nile nke Jehova, nke O mere Israel.


Ndi Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi huru omume uku nile nke Jehova, nke O mere Israel.


O rue, mb͕e Gideon nwuru, na umu Israel laghachiri, soro Bealim nākwa iko, doro onwe-ha Beal-berit ka ọ buru chi.


Unu we hu na Nehash, bú eze umu Amom, biara imegide unu, unu we sim, É-è, kama otù eze gāburu ayi eze: ma Jehova, bú Chineke-unu, bu eze-unu.


Ọ̀ bughi obìbì ọka wheat ta? M'gākpọku Jehova, Ọ gēnye kwa éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo; mara-kwa-nu hu kwa na ihe ọjọ unu riri nne, nke unu meworo n'anya Jehova, n'iriọrọ onwe-unu eze.


Ndi Israel nile we si Samuel, Kpere Jehova, bú Chineke-gi, ekpere bayere ndi-orù-gi, ka ayi ghara inwu: n'ihi na ayi atukwasiwo ihe ọjọ a na nmehie-ayi nile, n'iriọrọ onwe-ayi eze.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan