Ndị Ikpe 2:12 - Bible Nso12 ha we rapu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Onye nēme ka ha si n'ala Ijipt puta, ha we jezo chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ ha gburugburu, ha we kpọ isi ala nye ha: we kpasue Jehova iwe. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a12 Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe. Faic an caibideil |
Ma agēme ka onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu, nwua; n'ihi na o kwuworo okwu nwezuga megide Jehova, bú Chineke-unu, (Onye nēme ka unu si n'ala Ijipt puta, Onye nāb͕aputa kwa gi n'ulo ndi-orù), ka o we duhie gi n'uzọ ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu ije ije nime ya. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.