Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 19:9 - Bible Nso

9 Nwoke ahu we bilie ila, ya onwe-ya, na iko-ya nwayi, na nwa-okorọbia-ya; ma ọgọ-ya, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, siri ya, Biko, le, ike agwu ubọchi, o rubewo anyasi, biko, nọnu ọnọdu-abali: le, ubọchi erudawo, nọ ọnọdu-abali n'ebe a, ka o we diri obi-gi nma; ma bilienu n'isi-ututu echi ije ije-unu, ka i we la n'ulo-ikwū-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mgbe nwoke ahụ na iko ya nwanyị, na ohu ya, jikeere ịhapụ, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, lee chi ebidola iji ugbu a, abalị adịkwala nso. Biko, nọgide nʼụlọ m naanị abalị taa. Anyị ga-emekwa onwe anyị obi ụtọ abalị taa niile. Ma unu ga-amalite ije unu nʼisi ụtụtụ echi. Mgbe ahụ, unu ga-ala nʼudo.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 19:9
8 Iomraidhean Croise  

Absalom we nye ndi-orù-ya iwu, si, Biko, lezienu anya. mb͕e obi Amnon di nma na manya-vine; mb͕e m'si kwa unu, Tibuenu Amnon, menu ka ọ nwua, unu atula egwu: ọ̀ bughi na mu onwem enyewo unu iwu? dinu ike, buru-kwa-nu ndi-dìnkpà.


Anyala isi bayere echi; N'ihi na i maghi ihe chi gābọ.


Ha we rugide Ya, si, Nọyere ayi: n'ihi na o rubewo anyasi, ubọchi agamiwo kwa ub͕u a. O we ba n'ulo inọyere ha.


Ma nwoke ahu ekweghi inọ ọnọdu-abali, kama o biliri la, o we biarue ncherita-iru Jebus (nke ahu bu Jerusalem): inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa nēso kwa ya, iko-ya nwayi nēso kwa ya.


Ha we nọdu, rikọ ihe, ṅukọ kwa ihe-ọṅuṅu, ha abua: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si nwoke ahu, Biko, kwere, nọ ọnọdu-abali, ka obi-gi di kwa nma.


O we bilie n'isi-ututu n'ubọchi nke-ise ila; nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si, Biko, nwe ume n'obi-gi, o we b͕agwoju ha anya rue mb͕e ubọchi rudara; ha abua we rikọ ihe.


Boaz we rie ihe, @nu kwa ihe-ọ@nu@nu, obi-ya we di nma, o we ba idina ala na nsọtu obo ọka: Rut we ba nwayọ, kpughepu ukwu-ala-ya abua, dina ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan