Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 19:3 - Bible Nso

3 Nwoke-ya we bilie, jeso ya, igwa ya okwu gābà ya n'obi, ime ka ọ lata, nwa-okorọbia-ya na inyinya-ibu abua soro kwa ya je: nwayi ahu we me ka ọ ba n'ulo nna-ya: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, ṅuria izute ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nwoke ahụ kpebiri ịga nʼụlọ nna nwaagbọghọ ahụ ịrịọ ya ka ọ lọghachi. Ọ kpọọrọ otu nʼime ndị ohu ya, duru ịnyịnya ibu abụọ. Mgbe nwoke ahụ bịaruru nʼụlọ ahụ, iko ya nwanyị kpọbatara ya nʼụlọ nna ya. Mgbe nna nwaagbọghọ ahụ hụrụ ya, o jiri ọṅụ kelee ya ekele.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 19:3
16 Iomraidhean Croise  

Nkpuru obi ya we rapara n'aru Daina nwa-nwayi Jekob, ọ hu nwa-ab͕oghọ ahu n'anya, gwa nwa-ab͕ọghb͕ọ ahu okwu nābà ya n'obi.


Ma ub͕u a unu atula egwu: mu onwem ganāzù unu na umu-ntakiri-unu. Ọ we kasie ha obi, gwa ha okwu nāba ha n'obi.


Ọ si, Le, ọ buru na nwoke achupu nwunye-ya, nwayi ahu ewe si n'ebe ọ nọ la, we ghọ nwunye nke nwoke ọzọ, di mbu ya, ọ̀ gālu kwa ya ọzọ? àgaghi-emeru ala ahu emeru nke-uku? Ma gi onwe-gi akwawo iko, gi na ọtutu ndi-iko: ì si na i gālaghachikutem? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi nka, le, Mu onwem gaje iràra ya, me ka ọ je n'ọzara, M'gāgwa kwa ya okwu nke gābà ya n'obi.


Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na i gākpọm Chi; i gaghi-akpọkwam Beal ọzọ.


Akpọla nwa-nne-gi asi n'obi-gi: i ghaghi ibara madu-ibe-gi nba, ghara ibu nmehie bayere ya.


Nwoke nke ya na nwunye nwoke ọzọ nākwa iko, bú onye ya na nwunye madu-ibe-ya nākwa iko, aghaghi ime ka ha nwua, bú nwoke ahu nākwa iko, na nwayi ahu nākwa iko.


Iwe Chineke we di ọku n'ihi na ọ nēje: mọ-ozi nke Jehova we guzo onwe-ya n'uzọ ibu onye nēmegide ya. Ma ya onwe-ya nānọkwasi na nne-inyinya-ibu-ya, umu-okorọbia-ya abua so kwa ya.


Ma Josef di-ya, ebe ọ bu onye ezi omume, ma ọ chọghi igosi ya n'iru ọra, o zubere irapu ya na nzuzo.


O we si, Ọ dighi onye ọ bula, Onye-nwe-ayi. Jisus we si, Mu onwem amaghi kwa gi ikpé: ga nke gi. site n'ub͕u a adila nēmehie ọzọ.


Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi.


O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na mb͕e obìbì ọka wheat, na Samson were nwa-ewu leta nwunye-ya; ọ si, Ka m'bakuru nwunyem n'ime-ulo. Ma nna nwunye-ya ekweghi ka ọ ba.


Iko-ya nwayi ahu we kwa iko megide ya, si n'ebe ọ nọ la n'ulo nna-ya rue Bet-lehem-juda, nọ n'ebe ahu ubọchi ruru ọnwa anọ.


Nwayi ahu we bia n'isi-ututu, da n'ọnu-uzọ ulo nwoke ahu ebe onye-nwe-ya nọ, rue mb͕e ìhè putara.


Ọgọ-ya nwoke, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, we jide ya; o we nọ n'ulo-ya ubọchi atọ: ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan