Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 19:18 - Bible Nso

18 Ọ si ya, Ayi onwe-ayi nēsi na Bet-lehem-juda gabiga rue akuku azu ugwu Efraim; ebe ahu ka m'si bia, m'we je Bet-lehem-juda: ọ bu kwa ulo Chineke ka mu onwem nēje; ma ọ dighi nwoke nāchikọtam na ndim n'ulo-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Nwoke ahụ zara sị ya, “Anyị si Betlehem dị na Juda na-alọghachi nʼụlọ anyị dị nʼebe dị anya nʼala ugwu ugwu Ifrem. Esi m ebe ahụ gaa Betlehem dị na Juda, ma ugbu a, ana m aga nʼụlọ Onyenwe anyị. O nweghị onye kpọbatara anyị nʼụlọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 19:18
12 Iomraidhean Croise  

Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n'otù, Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n'otù:


Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi; Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.


Ọ buru na onye ọ bula anọgideghi nimem, atupu ya n'èzí dika alaka, ọ kpọnwu kwa; ha we chikọta ha, tubà ha n'ọku, ewe rechapu ha ọku.


Nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha na Shailo, ma ulo-ikwū nzute n'ebe ahu: ewe buda ala ahu n'iru ha.


Otù nwa-okorọbia di kwa nke sitere na Bet-lehem-juda, site n'ab͕uru Juda, onye ahu bu onye Livai, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa n'ebe ahu.


Ha we doro onwe-ha arusi apiri api nke Maika, bú nke o mere, ubọchi nile ulo Chineke di na Shailo.


O welie anya-ya abua, hu onye-ije ahu n'amá obodo; agadi nwoke ahu we si, Òle ebe i nēje? òle ebe i si bia kwa?


Otú ọ di, ma okporo-ọka ma nri-anu-ulo diri inyinya-ibu-ayi; ọzọ kwa, achicha na manya-vine dirim, di-kwara-ra orù-gi nwayi, di-kwara nwa-okorọbia nke nēso ndi-orù-gi: ọ dighi ihe ọ bula nākọ ayi.


O rue, n'ubọchi nke-anọ, na ha biliri n'isi-ututu, o we bilie ila: nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si ọgọ-ya, Were iberibe achicha nwe ume n'obi-gi, ma emesia unu gāla.


Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.


Nwoke a we si n'obodo-ya nārigo kwa-arọ ikpọ isi ala na ichuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha àjà n'ime Shailo. Ọ bu kwa n'ebe ahu ka umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, ndi-nchu-àjà Jehova, nọ.


Ọ bu kwa otú a ka Elkena nēme kwa-arọ, mb͕e ọ bula Hana rigoro n'ulo Jehova, otú a ka Penina nākpasu ya iwe; o we kwa ákwá, ghara iri ihe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan