Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 19:10 - Bible Nso

10 Ma nwoke ahu ekweghi inọ ọnọdu-abali, kama o biliri la, o we biarue ncherita-iru Jebus (nke ahu bu Jerusalem): inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa nēso kwa ya, iko-ya nwayi nēso kwa ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ma nwoke ahụ ekweghị ịnọ ọnọdụ abalị ọzọ, ọ hapụrụ gawa nʼụzọ ije Jebus (ya bụ Jerusalem), ya na ịnyịnya ibu ya abụọ akwadoro maka njem nakwa iko ya nwanyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 19:10
7 Iomraidhean Croise  

Eze na ndikom-ya we jerue Jerusalem jekuru ndi Jebus, bú ndi bi n'ala ahu: ha we gwa Devid okwu, si, I gaghi-abata n'ebe a, kama ndi-ìsì na ndi-ngwurọ gēme ka i wezuga onwe-gi: nāsi, Devid agaghi-abata n'ebe a.


Ma ndi Jebus, ndi bi na Jerusalem, umu Juda apughi inapu ha ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Juda nime Jerusalem, rue ta.


ókè-ala ahu we rigo na ndagwurugwu nwa Hinom rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida (ndida ahu bu Jerusalem): ókè-ala ahu we rigo rue elu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu Hinom n'akuku Ọdida-anyanwu, nke di na nsọtu ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu:


na Zela, na Elef, na ndi Jebus (nke ahu bu Jerusalem), na Gibeat, na Kiriat; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin dika ab͕uru nile ha si di.


Umu Juda we buso Jerusalem agha, were ya, were ọnu nma-agha tib͕ue ya, su obodo ahu ọku.


Nwoke ahu we bilie ila, ya onwe-ya, na iko-ya nwayi, na nwa-okorọbia-ya; ma ọgọ-ya, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, siri ya, Biko, le, ike agwu ubọchi, o rubewo anyasi, biko, nọnu ọnọdu-abali: le, ubọchi erudawo, nọ ọnọdu-abali n'ebe a, ka o we diri obi-gi nma; ma bilienu n'isi-ututu echi ije ije-unu, ka i we la n'ulo-ikwū-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan