Ndị Ikpe 19:10 - Bible Nso10 Ma nwoke ahu ekweghi inọ ọnọdu-abali, kama o biliri la, o we biarue ncherita-iru Jebus (nke ahu bu Jerusalem): inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa nēso kwa ya, iko-ya nwayi nēso kwa ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a10 Ma nwoke ahụ ekweghị ịnọ ọnọdụ abalị ọzọ, ọ hapụrụ gawa nʼụzọ ije Jebus (ya bụ Jerusalem), ya na ịnyịnya ibu ya abụọ akwadoro maka njem nakwa iko ya nwanyị. Faic an caibideil |
Nwoke ahu we bilie ila, ya onwe-ya, na iko-ya nwayi, na nwa-okorọbia-ya; ma ọgọ-ya, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, siri ya, Biko, le, ike agwu ubọchi, o rubewo anyasi, biko, nọnu ọnọdu-abali: le, ubọchi erudawo, nọ ọnọdu-abali n'ebe a, ka o we diri obi-gi nma; ma bilienu n'isi-ututu echi ije ije-unu, ka i we la n'ulo-ikwū-gi.