Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 18:9 - Bible Nso

9 Ha si, Bilie, ka ayi rigo kwa imegide ha: n'ihi na ayi ahuwo ala ahu, ma, le, ọ di nma nke-uku: ùnu onwe-unu nāb͕a kwa nkiti? unu adila ume-ngwu ije na ibà inweta ala ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ha zara sị, “Bịanụ, ka anyị gaa buso ha agha. Anyị ahụla ala ahụ, ọ dịkwa mma nke ukwu. Gịnị ka unu na-agbara nkịtị? Unu egbula oge ịba nʼebe ahụ nweta ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 18:9
13 Iomraidhean Croise  

Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya.


Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-gi ndia nile; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi.


Eze Israel we si ndi-orù-ya, Ùnu mara na ọ bu ayi nwe Remot-gilead, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti, ghara inaputa ya n'aka eze Siria?


Keleb we me ka ndi Israel b͕a nkiti n'ebe Moses nọ, ọ si, Ka ayi rigo nọ, nweta ya; n'ihi na ayi puru ime ya nke-ọma.


Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà.


Joshua we si umu Israel, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu gābu ndi-ume-ngwu ibà inweta ala ahu, nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nyeworo unu?


Mb͕e unu biara, unu gābiakute ndi nọ na ntukwasi-obi, ala ahu sara mbara n'aka abua: n'ihi na Chineke enyewo ya n'aka-unu; bú ebe nke ọ nādighi ihe ọ bula nke di n'uwa nakọ n'ebe ahu.


Ha we biakute umu-nne-ha rue Zọra na Eshtaol: umu-nne-ha we si ha, Gini ka unu onwe-unu gēkwu?


Menu onwe-unu ka unu di ike, buru-kwa-nu ndikom, unu ndi Filistia, ka unu ghara iburu ndi-Hibru ndi-orù, dika ha buruworo unu ndi-orù: burunu ndikom, bu-kwa-nu agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan