Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 18:5 - Bible Nso

5 Ha we si ya, Biko, jua Chineke ase, ka ayi we mara ma ije-ayi, bú nke ayi onwe-ayi nēje, gāga nke-ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ha sịrị ya, “Ọ dị mma! Biko, jụta Chineke ase, chọpụta ma ije anyị a ọ ga-agakwa nke ọma.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 18:5
12 Iomraidhean Croise  

Jehoshafat we si eze Israel, Biko, buru uzo ju ase okwu Jehova.


Eze, bú Ehaz, we nye Uraija, bú onye-nchu-àjà, iwu, si, N'elu ebe-ichu-àjà uku ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku ututu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, na àjà-nsure-ọku nke eze, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, ha na àjà-nsure-ọku nke ndi nile nke ala nka, na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha; ọbara nile nke àjà-nsure-ọku, na ọbara nile nke àjà, n'elu ya ka i gāwusa kwa ya: ma ebe-ichu-àjà ọla ahu gādirim iji ju ase.


Ahuhu gādiri umu nēwezuga onwe-ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ndi nēme ihe ezubeworo, ma o siteghi n'akam; ndi ji ihe-nkpuchi ekpuchi ihe, ma ọ bughi nke Mọm, ka ha we were nmehie tukwasi na nmehie:


N'ihi na eze Babilon guzoro n'ab͕ata uzọ, n'isi uzọ abua ahu, iju ase: o feghariri àkú-ya nile, jua ase n'aka terafim-ya, lekwasi imeju anya.


Ndim nāju ase n'aka osisi-ha, nkpa-n'aka-ha nēgosi kwa ha ihe: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile emewo ka ha kpafue, ha we pua n'okpuru Chineke-ha kwa iko.


onye ha nile, site n'onye ntà rue onye uku nāṅa nti, si, Onye a bu ike ahu nke Chineke nke anākpọ Ike Uku.


Maika we si, Ub͕u a ka m'mara na Jehova gēmem nma, n'ihi na onye Livai burum onye-nchu-àjà.


Nwoke ahu, bú Maika, we nwe ulo Chineke, o we me ephod na teraphim, mejue aka nke otù nime umu-ya ndikom, o we ghọrọ ya onye-nchu-àjà.


Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala Laish, we za, si umu-nne-ha, Ùnu amawo na ephod na teraphim na arusi apiri api na arusi awuru awu di n'ulo ndia? ma ub͕u a, maranu ihe unu gēme.


O we si ha, Otú a na otú a ka Maika meworom, o gowokwam ọlu, m'we ghọrọ ya onye-nchu-àjà.


Onye-nchu-àjà ahu we si ha, Jenu n'udo: na ncherita-iru Jehova ka uzọ-unu di, nke unu nēje ije nime ya.


(Na mb͕e gara aga n'Israel, otú a ka otu nwoke siri mb͕e o jere iju Chineke ase, Bianu, ka ayi jekuru onye-ọhu-uzọ: n'ihi na onye anākpọ Onye-amuma ta, anākpọ ya Onye-ọhu-uzọ na mb͕e gara aga).


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan