Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 18:4 - Bible Nso

4 O we si ha, Otú a na otú a ka Maika meworom, o gowokwam ọlu, m'we ghọrọ ya onye-nchu-àjà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nwokorobịa ahụ kọwara ha ihe Maịka meere ya. Ọ gwara ha, “O nyere m ọrụ, abụkwa m onye nchụaja ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 18:4
16 Iomraidhean Croise  

Imata iru madu n'ikpé adighi nma: Ọ dighi kwa nma ka madu ji n'ihi iberibe nri nējehie.


Nkita-ya nile nēribiga ihe ókè, ha amaghi afọ-ojuju; ndi ahu bu kwa ndi-ọzùzù-aturu nāmaghi ighọta ihe: ha nile echewo uzọ nke aka ha iru, onye ọ bula ọ che urù-ya iru site n'akuku nile ọ bula.


Unu we me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ndim n'ihi nju-aka ọka barley na n'ihi iberibe achicha, ime ka nkpuru-obi nwua, bú ndi nēkwesighi inwu anwu, na ime ka nkpuru-obi di ndu, bú ndi nēkwesighi idi ndu, site n'okwu-ugha unu nāgwa ndim ndi nānu okwu-ugha.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na otù onye di n'etiti unu nke nēmechi uzọ, ka unu we ghara ifunwu ọku nke ebe-ichu-àjàm n'efu! ọ dighi ihe-unu nātọm utọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gaghi-anara kwa onyinye-inata-iru-ọma n'aka-unu nke-ọma.


Agu ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo ma-ọbu uwe nke onye ọ bula agughm.


onye nādighi-ese okwu site n'iṅubiga manya ókè, onye nādighi-eti madu aka; kama onye nwere obi-ọma, onye nādighi-alu ọ̀gù, onye nādighi-ahu ego n'anya;


ndi anāghaghi imechi ọnu-ha; ha bu madu ndi nēkpù madu dum di n'èzí-na-ulo iru, nēzí ihe nke nēkwesighi ka ha zí, n'ihi urù nēweta ihere.


Nime anya-uku ka ha gēji kwa okwu nrafu di iche iche were unu zua ahia: ndi ọmuma-ikpe-ha nābughi ihe nādighi-alu ọlu site n'oge ochie, ila-n'iyì-ha adighi-atu kwa ura.


Maika we si ya, Biri n'ulom, ghọ-kwa-ram nna na onye-nchu-àjà, mu onwem gēnye kwa gi ego ọla-ọcha iri kwa-arọ, na nke-ekike uwe, na ihe i gēji di ndu. Onye Livai we ba nime.


Maika we mejue aka onye Livai ahu, nwa-okorọbia ahu we ghọrọ ya onye-nchu-àjà, nọ n'ulo Maika.


Mb͕e ndi ahu nọrọ nso ulo Maika, ha onwe-ha matara olu nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai: ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, si ya, Ònye mere ka i bia ebe a? ọ̀ bu kwa gini ka gi onwe-gi nēme n'ebe a? gini ka i nwe-kwa-ra n'ebe a?


Ha we si ya, Biko, jua Chineke ase, ka ayi we mara ma ije-ayi, bú nke ayi onwe-ayi nēje, gāga nke-ọma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan