Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 18:29 - Bible Nso

29 Ha we kpọ aha obodo ahu Dan, n'aha Dan, bú nna-ha, onye amuru nye Israel: otù ọ di, Laish bu aha obodo ahu na mbu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ aha obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna ha ochie, onye bụ nwa Izrel. Ma tupu ebo Dan ebibie ya, aha obodo a nʼoge gara aga bụ Laish.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 18:29
11 Iomraidhean Croise  

Mb͕e Abram nuru na adọtara nwa-nne-ya n'agha, ọ chiputa ndi-ya eziri ibu agha, bú ndi amuru n'ulo-ya, ọgu iri-na-ise na iri na asatọ, ọ we nāchu ha rue Dan.


Rechel we si, Chineke ekpeputawom, ọzọ kwa, ọ nuwo olum, we nyem nwa-nwoke: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Dan.


Ọ si, Ọ bughi Jekob ka agākpọ aha-gi ọzọ, kama Israel: n'ihi na i jisiwo ike n'ebe Chineke nọ na n'ebe madu nọ, i we nwe ike.


Ma anamadu ọdu ka achikọtasia Israel nile n'ebe i nọ site na Dan we rue Bia-sheba, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba: ka iru-gi nēje kwa n'agha ahu.


Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel, o we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-bet-meaka, na Kinerot nile, tiyere ala nile nke Naftali.


Site na Dan ka anuru ima-imi nke inyinya-ya nile: site n'olu ọbube nile nke inyinya-ya nile di ike ala nka nile amawo jijiji; ha we bia richapu ala na ùjú-ya; obodo na ndi bi nime ya.


Moses we si n'ala ihe nādighi nke Moab rigorue ugwu Nebo, rue elu Pisga, nke di n'iru Jeriko. Jehova we me ka ọ hu ala ahu nile; Gilead, rue Dan;


Ókè-ala umu Dan we si n'ebe ha nọ pua: umu Dan we rigo, buso Leshem agha, were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, ha we nweta ya, biri nime ya, we kpọ Leshem, Dan, dika aha Dan, bú nna-ha, si di.


Ndikom ise ahu we je, biarue Laish, hu ndi ahu nke bi n'etiti ya, ka ha nēbi na ntukwasi-obi, dika ọme-n'ala ndi Zaidon si di, nādi jū nātukwasi kwa obi; ọ dighi kwa onye nēme ka ihere me ha n'okwu ọ bula n'ala ahu, bú onye nēnweta ike nb͕ochi, n'ebe di ndi Zaidon anya ka ha bi, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ.


Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan