Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 18:28 - Bible Nso

28 Ma onye-nnaputa adighi, n'ihi na ebe di Zaidon anya ka ọ bu, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ; ebe ahu di kwa na ndagwurugwu nke di n'akuku Bet-rehob. Ha we wue obodo ahu, biri nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Ọ dịghị onye ọbụla nwere ike bịa inyere ndị obodo ahụ aka nʼihi ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo Saịdọn. O nwekwaghị obodo ọbụla ha na ha na-emekọrịta. Obodo a dị na ndagwurugwu dị nso na Bet-Rehob. Emesịa, ndị ebo Dan wughachiri obodo ahụ ọzọ, biri nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 18:28
14 Iomraidhean Croise  

Umu Amon we hu na ha nēsì Devid ísì ọjọ, umu Amon we ziga, go Siria Bet-rehob na Siria Zoba, orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri ndi ji ukwu eje, na eze Meaka, ya na nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndikom Tob, bú orú nnù ndikom na nnù iri.


Nwayi nējere gi ozi nwe-kwa-ra umu-ndikom abua, ha abua we lua ọ̀gù n'ọhia, ọ dighi kwa onye-nnaputa n'etiti ha, ma otù onye tib͕uru ibe-ya, me ka ọ nwua.


ha we biarue Gilead, ru kwa ala Tahtim-họdshi; ha we biarue Dan-jaan, je buruburu rue Zaidon,


Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke, Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:


Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum, Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi.


O we si, I gaghi-aṅuri kwa Ọṅu-agha ọzọ, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke anēmeb͕u, bú ada Zaidon: bilie, gabiga rue Kitim; ọbuná n'ebe ahu ọ dighi izu-ike i gēnwe.


Ka ihere me gi, Zaidon: n'ihi na oké osimiri ekwuwo, bú ebe siri ike nke oké osimiri, si, Ime emeghm, amuputakwaghm nwa, emekwaghm ka umu-okorọbia toputa, emekwaghm ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke tozue okè.


Ha we rigo, ledo ala ahu site n'ọzara Zin rue Rehob, na nbata Hemat.


Jehova we nye ha n'aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n'akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha.


na Ebron, na Rehob, na Hamon, na Kena, we rue Zaidon bara uba;


Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel: na mb͕e ahu ebo ndi Dan nāchọrọ onwe-ha ala-nketa ibiri ebiri; n'ihi na ọ dighi ala bara n'aka-ha n'ihe-nketa n'etiti ebo Israel nile rue ubọchi ahu.


Ha we kpọ aha obodo ahu Dan, n'aha Dan, bú nna-ha, onye amuru nye Israel: otù ọ di, Laish bu aha obodo ahu na mbu.


Ndikom ise ahu we je, biarue Laish, hu ndi ahu nke bi n'etiti ya, ka ha nēbi na ntukwasi-obi, dika ọme-n'ala ndi Zaidon si di, nādi jū nātukwasi kwa obi; ọ dighi kwa onye nēme ka ihere me ha n'okwu ọ bula n'ala ahu, bú onye nēnweta ike nb͕ochi, n'ebe di ndi Zaidon anya ka ha bi, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan