Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 18:2 - Bible Nso

2 Umu Dan we si n'ab͕uru-ha ziga ndikom ise sitere n'ọnu-ọgugu-ha nile, bú ndi-dìnkpà, site na Zọra, site kwa n'Eshtaol, iledo ala ahu, na ileputa ya; ha we si ha, Jenu, leputanu ala ahu: ha we bia ugwu Efraim, rue ulo Maika, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nʼihi nke a, ebo Dan sitere nʼikwu ise dị nʼebo ha họpụta mmadụ ise. Ndị a bụ dimkpa, na dike nʼagha, bụrụkwa ndị si nʼobodo Zora na Eshtaol. Ha zipụrụ mmadụ ise ndị a ka ha gaa nyochaa ala ahụ ha na-achọ ibi nʼime ya. Mgbe ndị ahụ jeruru obodo ugwu ugwu Ifrem, ha gara nọdụ ọdụ abalị nʼụlọ Maịka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 18:2
20 Iomraidhean Croise  

Josef we cheta nrọ abua ahu nke ọ rọrọ bayere ha, ọ si ha, Ndi-nledo ka unu bu; ihu ọb͕ub͕a-ọtọ ala ka unu biaworo.


Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike: Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha.


Moses we ziga ha iledo ala Kenean, ọ si ha, Rigonu n'uzọ a nime Negeb, rigo-kwa-nu n'ugwu:


Ma-ọbu òle eze, mb͕e ọ nāga ibu agha megide eze-ibe-ya, nāgaghi-ebu uzọ nọdu ala b͕a ìzù ma ọ puru ichi orú nnù ndi-agha na nnù ise zute onye chiri ọgu nnù ndi-agha abua na nnù iri bia imegide ya?


N'ebe di ala ala, Eshtaol, na Zọra, na Ashna;


Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh;


Joshua nwa Nun we si na Shitim zipu ndikom abua na nzuzo, bú ndi-nledo, si, Jenu, le ala ahu, na Jeriko. Ha we je, ba n'ulo otù nwayi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, ha we dina n'ebe ahu.


Ewe gwa eze Jeriko okwu, si, Le, ndikom batara n'ebe a n'abali a sitere n'umu Israel ileputa ala-ayi.


Ma otù nwoke nke Zọra di, sitere n'ab͕uru ndi Dan, aha-ya bu Manoa; ma nwunye-ya bu nwanyi-àgà, ọ mughi kwa nwa.


Mọ nke Jehova we malite ikwali obi-ya na Mahane-dan, n'etiti Zọra na Eshtaol.


Umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we rida, bulie ya, bugota ya, lìe ya n'etiti Zọra na Eshtaol n'ílì Manoa, bú nna-ya. O we kpe Israel ikpe orú arọ.


Ma otù nwoke nke ugwu Efraim di, aha-ya bu Maika.


Nnù ndikom na ọgu iri ndi ekere ihe-agha, ndi sitere n'ab͕uru ndi Dan, we si n'ebe ahu, bú Zọra na Eshtaol, bulie ije.


Ha we si n'ebe ahu gabiga rue ugwu Efraim, biarue ulo Maika.


Mb͕e ndi ahu nọrọ nso ulo Maika, ha onwe-ha matara olu nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai: ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, si ya, Ònye mere ka i bia ebe a? ọ̀ bu kwa gini ka gi onwe-gi nēme n'ebe a? gini ka i nwe-kwa-ra n'ebe a?


Ha we biakute umu-nne-ha rue Zọra na Eshtaol: umu-nne-ha we si ha, Gini ka unu onwe-unu gēkwu?


O rue, na mb͕e ahu, mb͕e eze nādighi n'Israel, na otù nwoke, bú onye Livai, di nānọ dika ọbìa n'akuku azu ugwu Efraim, o we si na Bet-lehem-juda kuru n'onwe-ya nwayi bu iko.


Ọ si ya, Ayi onwe-ayi nēsi na Bet-lehem-juda gabiga rue akuku azu ugwu Efraim; ebe ahu ka m'si bia, m'we je Bet-lehem-juda: ọ bu kwa ulo Chineke ka mu onwem nēje; ma ọ dighi nwoke nāchikọtam na ndim n'ulo-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan