Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 18:17 - Bible Nso

17 Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala ahu, we rigo, ba n'ebe ahu, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu: ma onye-nchu-àjà ahu nēguzo n'oghere ọnu-uzọ-ama, ya na nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Mgbe ahụ, ndị nnyocha ise ahụ banyere nʼime ụlọ ahụ buru arụsị ọla ahụ, na efọọd ahụ, na arụsị ezinaụlọ ndị ahụ, ma onye nchụaja ahụ na narị ndị agha isii ndị ji ngwa agha guzo nʼọnụ ụzọ ama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 18:17
19 Iomraidhean Croise  

Ma Leban jere ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya: Rechel we zue teraphim nke nna-ya nwere n'ori.


Ma ub͕u a, i lawo n'ezie, n'ihi na agu ulo nna-gi gusiri gi ike, ma n'ìhi gini ka i zuworo chim-hà?


O we were nwa-ehi ahu nke ha mere, sure ya n'ọku, gwe ya rue mb͕e o mere irighiri, o we fesa ya n'elu miri, me ka umu Israel ṅua ya.


Le, ha nile bu ajọ ihe; ihe-efu ka ọlu nile ha bu: ifufe na ebe tọb͕ọrọ n'efu ka arusi nile ha awuru awu bu.


Ha nēbuli ya n'ubu, n'ebu ya, we dọba ya n'ọnọdu-ya, o we guzo; ọ gaghi-esi n'ebe-ya pua: e, madu gētiku ya nkpu, ma ọ gaghi-aza, ọ gaghi-azọputa ya n'ahuhu-ya.


N'ihi na eze Babilon guzoro n'ab͕ata uzọ, n'isi uzọ abua ahu, iju ase: o feghariri àkú-ya nile, jua ase n'aka terafim-ya, lekwasi imeju anya.


N'ihi na ọtutu ubọchi ka umu Israel gānọdu nēnweghi eze, nēnweghi kwa onye-isi, nēnweghi kwa àjà, nēnweghi kwa ogidi, nēnweghi kwa ephod na teraphim:


M'gēbipu kwa arusi-gi nile apiri api na ogidi-gi nile n'etiti gi; i gaghi-akpọ kwa isi ala nye ọlu aka-gi ọzọ.


Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala Laish, we za, si umu-nne-ha, Ùnu amawo na ephod na teraphim na arusi apiri api na arusi awuru awu di n'ulo ndia? ma ub͕u a, maranu ihe unu gēme.


Nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha-ha, bú ndi sitere n'umu Dan, nēguzo kwa n'oghere ọnu-uzọ-ama.


Ma mb͕e ndia bara n'ulo Maika, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu, onye-nchu-àjà ahu we si ha, Gini ka unu onwe-unu nēme?


Umu Dan we si n'ab͕uru-ha ziga ndikom ise sitere n'ọnu-ọgugu-ha nile, bú ndi-dìnkpà, site na Zọra, site kwa n'Eshtaol, iledo ala ahu, na ileputa ya; ha we si ha, Jenu, leputanu ala ahu: ha we bia ugwu Efraim, rue ulo Maika, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.


Joash we si ndi nile nke guzoro megide ya, Unu onwe-unu, ùnu gēkpere Beal ọnu-ya? ma-ọbu unu onwe-unu, ùnu gāzọputa ya? Onye nke gēkpere ya ọnu-ya, ka eme ka ọ nwua: rapu ya rue ututu; ọ buru na chi ka ọ bu, ya kpere onwe-ya ọnu-ya, n'ihi na akwatuwo ebe-ichu-àjà-ya.


Maikal we were terafim-ya, tọb͕ọ ya n'ihe-ndina-ya, tiye ákwà-ob͕ub͕o eji aji ewu me n'okpuru isi-ya, were ákwà-nb͕okwasi kpuchie ya.


Ewe were ib͕e Chineke; umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nwukwara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan