Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 17:3 - Bible Nso

3 Ọ we nyeghachi nne-ya nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu, nne-ya we si, Edoworom Jehova ọla-ọcha ahu nsọ n'ezie site n'akam inye nwam, ime arusi apiri api na arusi awuru awu: ma ub͕u a m'gēnyeghachi gi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe o nyeghachiri nne ya puku na narị ego ọlaọcha shekel ahụ, nne ya gwara ya sị, “Ana m edo ọlaọcha ndị a nsọ nye Onyenwe anyị nʼihi nwa m nwoke maka iji ya mee oyiyi a pịrị apị na arụsị a kpụrụ akpụ. Aga m emesịa nyeghachi gị ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 17:3
21 Iomraidhean Croise  

Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke oyiyi-ihe ahu, bú nke o mere, n'ulo Chineke, bú nke Chineke siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, Ṅ'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:


Unu emela chi ọzọ tiyerem; chi ọla-ọcha ma-ọbu chi ọla-edo, unu emerela onwe-unu ha.


Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-ọbu oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa:


Gi emerela onwe-gi chi akpuru akpu.


Unu gēmeru kwa ihe amachitara arusi ọla-ọcha gi nile apiri api, na ihe awuchitara arusi ọla-edo gi awuru awu: i gātusa ha dika ihe ruru inyi; i gāsi ya, Pua.


Onye nēb͕u ehi di ka onye nētib͕u madu; onye ji nwa-aturu achu àjà di ka onye nāb͕aji olu nkita; onye nēsure àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma, di ka onye nēsure ọbara ezì; onye nēsure frankincense ka ọ buru ihe-ncheta di ka onye nāgọzi ajọ ihe: e, ndi ahu arọputawo uzọ nile nke aka ha, ọ bu kwa ihe-árú nile ha nātọ nkpuru-obi-ha utọ;


Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.


Unu echela ihe-efu ọ bula iru, unu eme-kwa-lara onwe-unu chi ọ bula awuru awu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.


unu gākwatu kwa ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, sure Asherim-ha n'ọku, b͕utu arusi nile apiri api nke chi nile ha, we me ka aha-ha lapu n'iyì n'ebe ahu.


Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēme arusi apiri api ma-ọbu arusi awuru awu, bu ihe-árú nke Jehova, ọlu aka nke onye nātu akika, we tiye ya n'ebe nzuzo. Ndi Israel nile gāza kwa, si, Amen.


Maika we si, Ub͕u a ka m'mara na Jehova gēmem nma, n'ihi na onye Livai burum onye-nchu-àjà.


Ọ si nne-ya, Nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu i nwere nke ewere ewere, nke gi onwe-gi b͕ara iyi bayere ya, i we kwu kwa ya na ntim, le, ọla-ọcha ahu di n'akam; mu onwem were ya. Nne-ya we si, Onye agọziri agọzi diri Jehova ka nwam bu.


Ọ we nyeghachi nne-ya ọla-ọcha ahu, nne-ya we chiri ọgu ego ọla-ọcha iri, nye onye-nnucha-ọla, o we me ya arusi apiri api na arusi awuru awu: o we di n'ulo Maika.


Umu Dan we guzoro onwe-ha arusi ahu apiri api: Jonatan, nwa Giashom, nwa Moses, ya onwe-ya na umu-ya ndikom we buru ndi-nchu-àjà diri ebo Dan rue ubọchi emere ndi ala ahu ka ha je biri n'ala ọzọ.


Ha we si ya, Biko, jua Chineke ase, ka ayi we mara ma ije-ayi, bú nke ayi onwe-ayi nēje, gāga nke-ọma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan