Ndị Ikpe 16:25 - Bible Nso25 O rue, mb͕e obi-ha di nma, na ha siri, Kpọnu Samson, ka ọ we mere ayi ihe-ọchì. Ha we si n'ulo ndi ekere ab͕u kpọputa Samson; o we me ihe-ọchì n'iru ha: ha we me ka o guzo n'etiti ogidi. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a25 Mgbe ha ka nọ nʼobi ụtọ, ha tiri mkpu sị, “Dupụtara anyị Samsin, ka o kpaa anyị ọchị.” Ya mere, e dupụtara Samsin site nʼụlọ mkpọrọ ka o meere ha ihe egwuregwu. Ha mere ka o guzo nʼetiti ebe ogidi e ji wuo ụlọ ahụ dị. Faic an caibideil |
Nwoke ahu we bilie ila, ya onwe-ya, na iko-ya nwayi, na nwa-okorọbia-ya; ma ọgọ-ya, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, siri ya, Biko, le, ike agwu ubọchi, o rubewo anyasi, biko, nọnu ọnọdu-abali: le, ubọchi erudawo, nọ ọnọdu-abali n'ebe a, ka o we diri obi-gi nma; ma bilienu n'isi-ututu echi ije ije-unu, ka i we la n'ulo-ikwū-gi.