Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 16:24 - Bible Nso

24 Ndi ahu we hu ya, to chi-ha: n'ihi na ha siri, Chi-ayi enyewo onye-iro-ayi n'aka-ayi, bú onye nēme ka ala-ayi tọb͕ọrọ n'efu, onye me-kwa-ra ka ndi-ayi eb͕uru eb͕u ba uba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị, “Chi anyị enyela onye iro anyị nʼaka anyị, onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefu gbukwaa ọtụtụ ndị anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 16:24
14 Iomraidhean Croise  

Ha we yipu ihe-agha-ya, būru isi-ya na ihe-agha-ya, ziga n'ala ndi Filistia buruburu, izisara arusi nile ha na ndi-ha ozi ahu.


Ka ihere me ndi nile ndi nēfè arusi apiri api òfùfè, Ndi nānya isi n'ihe-efu di iche iche: Kpọnu isi ala nya Ya, unu chi nile.


Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi.


M'we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya-ha.


ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh:


Ha ṅuru manya-vine, we ja chi nile nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume.


N'ihi nka ka ọ nāchuru eriri-ya àjà, nēsurere ub͕u-ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; n'ihi na site na ha ka òkè-ya nwere urù, ihe-oriri-ya ma-kwa-ra abuba.


Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro, Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie, Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu, Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile.


Ndi bi n'elu uwa nāṅuri kwa ọṅu n'isi ha, obi nātọ kwa ha utọ; ha gēzigarita kwa onwe-ha onyinye; n'ihi na ndi-amuma abua ndia mekpara ndi bi n'elu uwa aru.


Mb͕e ya onwe-ya biaruru Lehi, ndi Filistia we tie nkpu n'izute ya: Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, udọ̀ abua nke di n'ogwe-aka-ya abua we di ka flax nke reworo n'ọku, ab͕u-ya nile we b͕azepu n'aka-ya abua.


Samson we si, Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo, otù obo, obo abua, Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo tib͕u nnù ndikom abua na ọgu iri.


O we tib͕ue ha ntib͕u uku, ogwe-ukwu n'elu apata-ukwu: ọ we rida, nọdu nime nb͕awa nke nkume di elu, bú Itam.


O rue, mb͕e obi-ha di nma, na ha siri, Kpọnu Samson, ka ọ we mere ayi ihe-ọchì. Ha we si n'ulo ndi ekere ab͕u kpọputa Samson; o we me ihe-ọchì n'iru ha: ha we me ka o guzo n'etiti ogidi.


Ha we bipu isi-ya, yipu ihe-agha-ya, ziga n'ala ndi Filistia buruburu, izisa ozi ahu n'ulo arusi nile ha, na n'etiti ndi-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan