Ma ọbuna n'ihe a kwa, mb͕e ha nọ n'ala ndi-iro-ha, M'gaghi-aju ha, M'gaghi-asọ kwa ha oyi, ime ka ha gwusia, na imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ha b͕ara: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke ha:
N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya, Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya; Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo, Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru.