Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 16:20 - Bible Nso

20 O we si, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n'ura-ya, si, M'gāpu dika m'nēme ub͕ò ub͕ò, we meghari aru. Ma ya onwe-ya amaghi na Jehova esiwo n'ebe ọ nọ wezuga Onwe-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma mgbe Samsin bilitere site nʼụra, o chere nʼobi ya, “Aga m apụ ka m si mee na mbụ megharịa arụ ma nwere onwe m.” Ma ọ maghị na Onyenwe anyị ahapụla ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 16:20
21 Iomraidhean Croise  

o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu.


Ònye were Jekob nye ka ọ ghọ ihe apunaraworo madu, were Israel nye ndi nāluta ihe n'agha? ọ̀ bughi Jehova? bú Onye ayi mehieworo megide, Onye ha nēkweghi kwa eje ije n'uzọ-Ya nile, ha egeghi kwa nti iwu-Ya.


Ndi ala ọzọ eripiawo ike-ya, ma ya onwe-ya amagh: e, efesawo ya isi-awọ, ma ya onwe-ya amaghi.


Nání, unu enupukwala isi n'aka Jehova, unu onwe-unu atu-kwa-la egwu ndi ala ahu; n'ihi na nri-ayi ka ha bu: ihe-nchegide-ha ewezugawo onwe-ya n'aru ha, ma Jehova nọyere ayi: unu atula egwu ha.


M'we kuru ya biakute ndi nēso uzọ-Gi, ma ha apughi ime ka aru-ya di ike.


O we si ha, N'ihi okwukwe ntà unu: n'ihi na n'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi ugwu a, Si n'ebe a gabiga n'ebe ahu; ọ gāgabiga kwa; ihe ọ bula agaghi-adi kwa nke unu nāpughi ime.


ọ bughi na ayi ruru n'onwe-ayi, igu ihe ọ bula dika o sitere n'onwe-ayi; kama iru-eru-ayi sitere na Chineke;


Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri, Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga, Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha, Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?


Umu Israel apughi kwa iguzosi ike n'iru ndi-iro-ha, ha nāb͕akuta azu n'iru ndi-iro-ha, n'ihi na ha aghọwo ihe ewezugara ka ebibie ha: M'gaghi-anọyere unu ọzọ, ma ọ buru na unu ekpochapughi ihe ahu ewezugara nyem n'etiti unu.


O we were ǹtú ya, si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n'ura-ya, were ǹtú nke ihe eji akpà ákwà na ákwà ahu akpara, bulie ije-ya.


O we me ka Samson raru ura n'ikperè-ukwu-ya abua; o we malite iweda ya n'ala, ike-ya we si n'aru ya wezuga onwe-ya.


Ndi Filistia we jide ya, rukpọ anya-ya abua; ha we me ka ọ ridarue Geza, were ihe ọla abua ke ya ab͕u; o we buru onye nēgwe ọka n'ulo ndi ekere ab͕u.


Samson we dina rue etiti abali, bilie n'etiti abali, jide ibo ọnu-uzọ-ama obodo, jide kwa ide-ya abua, ropu ha, tiyere nkpọrọ, tukwasi ha n'ubu-ya abua, būru ha rigo n'elu ugwu nke di n'iru Hebron.


Ma o nwere ndi nēche anwu nānọdu n'ime-ulo. O we si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we dọbìe akwara asa ahu, dika anādọbì eriri-nzuzu mb͕e aṅara ya ọku. Amaghi kwa ike-ya.


Ma Mọ nke Jehova wezugara Onwe-ya n'ebe Sọl nọ, mọ ọjọ we si n'ebe Jehova nọ me ka ọ tua egwu nke-uku.


O rue, n'echi-ya, na mọ ọjọ nke Chineke dakwasiri Sọl n'ike, o we bū amuma n'etiti ulo: Devid nēwere kwa aka-ya kpọ ubọ, dika ọ nēme kwa-ubọchi: ma ube di n'aka Sọl.


Sọl we nātu egwu Devid, n'ihi na Jehova nọyere ya, ma O siri n'ebe Sọl nọ wezuga Onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan