Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 16:2 - Bible Nso

2 Ewe gwa ndi Geza, si, Samson abiawo ebe a. Ha we b͕a ya buruburu, che ya anwu abali ahu nile n'ọnu-uzọ-ama obodo, nọdu du abali ahu nile, si, Ka ọ di rue ìhè ututu, ayi we b͕ue ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 A gwara ndị Gaza sị, “Samsin nọ nʼobodo a.” Nʼihi ya, ha gbara ebe ahụ gburugburu ma nọdụ na-eche nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ abalị niile. Ọ dịghị ihe ha mere nʼabalị ahụ nʼihi na ha zubere sị, “Mgbe chi bọrọ, anyị ga-egbu ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 16:2
11 Iomraidhean Croise  

Ma ndi-ọlu-ubi ahu, mb͕e ha huru ọkpara ahu, ha sirita onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, nwere kwa ihe-nketa-ya.


Ma mb͕e o ruru ututu, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nile nke ndi-Ju b͕ara ìzù megide Jisus ime ka Ọ nwua:


Ma mb͕e ọ bula unu gāhu Jerusalem ka achi usu-ndi-agha nọgide ya gburugburu, mb͕e ahu maranu na itọb͕ọrọ-n'efu-ya di nso.


Ya mere ub͕u a unu onwe-unu na nnọkọ-ikpé-ayi gosi onye-isi-ọchi-agha ka o kuda ya biakute unu, dika unu gaje itule ihe bayere ya nke-ọma kari: ma ayi onwe-ayi bu ndi edoziworo ib͕u ya mb͕e ọ kābiarughi unu nso.


ma emere ka Sọl mara ajọ ìzù-ha. Ha we nēche kwa ọnu-uzọ-ama nile ehihie na abali ka ha we b͕ue ya:


Akpiri we kpọ ya nku nke-uku, o we kpọkue Jehova, si, Gi onwe-gi esiwo n'aka orù-gi nye nzọputa uku a: ma ub͕u a m'gānwu n'akpiri-ikpọ-nku, dabà n'aka nke ndia anēbìghi úgwù.


Samson we dina rue etiti abali, bilie n'etiti abali, jide ibo ọnu-uzọ-ama obodo, jide kwa ide-ya abua, ropu ha, tiyere nkpọrọ, tukwasi ha n'ubu-ya abua, būru ha rigo n'elu ugwu nke di n'iru Hebron.


Sọl we ziga ndi-ozi n'ulo Devid, iche ya nche, na ime ka ọ nwua n'ututu: Maikal, bú nwunye-ya, we gosi Devid, si, Ọ buru na i zọputaghi ndu-gi abali a, agēme ka gi onwe-gi nwua echi.


Sọl we je n'otù akuku ugwu, Devid na ndikom-ya n'akuku nke-ọzọ nke ugwu ahu: Devid we zọlie ọsọsọ ib͕apu n'iru Sọl; ma Sọl na ndikom-ya nāb͕a Devid na ndikom-ya buruburu inwude ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan