Mb͕e ya onwe-ya biaruru Lehi, ndi Filistia we tie nkpu n'izute ya: Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, udọ̀ abua nke di n'ogwe-aka-ya abua we di ka flax nke reworo n'ọku, ab͕u-ya nile we b͕azepu n'aka-ya abua.
Chineke we b͕awa olùlù ahu nke di nime Lehi, miri we si nime ya puta; o we ṅua, mọ-ya we biaghachi, o we di ndu; n'ihi ya ọ kpọrọ aha-ya En-hakore, nke di na Lehi, rue ta.