n'ihi na, le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke: aguba agaghi-aga n'elu isi-ya: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ: ya onwe-ya gāmalite kwa izọputa Israel n'aka ndi Filistia.
O rue, mb͕e o hotara ib͕e Chineke, na o si n'oche-ya dala azu n'akuku ọnu-uzọ-ama, olu-ya we b͕ajie, o we nwua: n'ihi na nwoke ahu bu agadi, di kwa arọ́. Ya onwe-ya kpe-kwa-ra Israel ikpe ọgu arọ abua.