Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 15:15 - Bible Nso

15 O we huta ọkpukpu-àb͕à ọhu nke inyinya-ibu, setipu aka-ya, jide ya, were ya tib͕ue nnù ndikom abua na ọgu iri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Mgbe ahụ Samsin lere anya gburugburu, hụ ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu nke tọgbọrọ nʼala nʼebe ahụ. Ọ tụtụlitere ya, were ya tigbuo puku ndị agha Filistia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 15:15
14 Iomraidhean Croise  

Ndia bu aha ndi-dike, ndi Devid nwere; Josheb-bashebet onye-Tahkemonait, onye-isi nke ndi-ọchi-agha; onye ahu bu Adino onye-Eznait: onye nēmegide nnù ndikom abua eb͕uru n'otù ub͕ò.


Unu gāchu ndi-iro-unu, ha gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.


Madu ise n'etiti unu gāchu ọgu madu ise, ọgu madu ise n'etiti unu gāchu kwa orú nnù madu na nnù madu ise: ndi-iro-unu gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.


menyu ike ọku, b͕anari iru mma-agha, ndi esitere n'okwukwe me ka ha di ike site n'adighi-ike, me ka ha di ike n'agha, ndi sitere n'okwukwe chulaga usu-ndi-agha nke ndi ala ọzọ.


Otù nwoke nime unu nāchu nnù ndikom abua na ọgu iri: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù, dika Ọ gwara unu okwu.


Samson we si, Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo, otù obo, obo abua, Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo tib͕u nnù ndikom abua na ọgu iri.


O rue, mb͕e o kwubìri okwu, na ọ tupuru ọkpukpu-àb͕à-anu ahu n'aka-ya; o we kpọ ebe ahu Remat-lehi.


Mb͕e ọ gasiri Shamga nwa Anat we di, nke were ndudu eji achu ehi tib͕ue ndi Filistia, nnù ndikom na ọgu iri: ya onwe-ya kwa, ọ zọputara Israel.


Jael, bú nwunye Heba, we were ǹtú ulo-ikwū, jide kwa otùtù n'aka-ya, bakuru ya nwayọ, kpọbà ǹtú ahu n'akuku egedege-iru-ya, ǹtú we kpọpue ba n'ala; n'ihi na nwoke ahu di n'oké ura, ike gwu-kwa-ra ya; o we nwua.


O we kewa ọgu ndikom iri-na-ise ahu n'usu atọ, o tiye n'aka-ha nile opì-ike, na ite nke ihe nādighi nime ha, na ọwa n'etiti ite ahu.


Ntib͕u mbu ahu, nke Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya tib͕uru, we ra ka orú ndikom, n'ihe ra ka nkera furrow nke otù acre ala-ubi n'ọtùtù.


Jonatan we si nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha nke ndia anēbìghi úgwù: eleghi anya Jehova gāluru ayi ọlu: n'ihi na ihe-nb͕ochi adighi n'ebe Jehova nọ izọputa site n'iwere ọtutu madu ma-ọbu site n'iwere madu ole-na-ole.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan