Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 15:14 - Bible Nso

14 Mb͕e ya onwe-ya biaruru Lehi, ndi Filistia we tie nkpu n'izute ya: Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, udọ̀ abua nke di n'ogwe-aka-ya abua we di ka flax nke reworo n'ọku, ab͕u-ya nile we b͕azepu n'aka-ya abua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Mgbe ọ na-abịaru Lehi, ndị Filistia tiiri mkpu, bịa izute ya. Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼebe ọ dị ukwuu. Nke a mere ka eriri ahụ e kere ya nʼaka dịrị ka eriri ogho flakisi erere ọkụ, sitekwa nʼaka ya dapụsịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 15:14
22 Iomraidhean Croise  

Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu, Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?


Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.


O nēzi akam abua ibu agha; Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.


Fero gēkwu kwa okwu bayere umu Israel, si, Ndi atuhiworo n'ala ka ha bu, ọzara emechibidowo ha nime.


Ewe gosi eze Ijipt na ndi Israel ab͕alagawo: obi Fero na ndi-orù-ya we chigharia imegide ndi Israel, ha si, Gini bu nka ayi meworo, na ayi ezipuwo Israel n'ifè ayi?


Aṅulam ọṅu, gi onye-irom: mb͕e m'dara ada, m'bilie; mb͕e m'nānọdu n'ọchichiri, Jehova gāburum ìhè.


O we za, gwam okwu, si, Nka bu okwu Jehova nke Ọ gwara Zerubabel, si, Ọ bughi site n'usu-ndi-agha, ọ bughi kwa site n'ike, kama ọ bu site na Mọm, ka Jehova nke usu-ndi-agha siri.


E, ariọkwam gi, onye ekekọtaworo mu na gi n'ezie n'ọlu Chineke, yere ndinyom ahu aka, n'ihi na mu na ha b͕akọsiri nb͕a ike n'ozi oma, gi na Klement, na ndi fọduru mu na ha nālukọ ọlu, ndi aha-ha di n'akwukwọ nke ndu.


Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we ridarue Ashkelon, tib͕ue orú ndikom na iri n'etiti ha, chiri ihe-ha ọ lutara, nye ndi gosiworo ilu ahu uwe nb͕anwe. Iwe-ya we di ọku, o we rigorue ulo nna-ya.


Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we dọwa ya dika ọ gādọwa nwa-ewu, ma ọ dighi ihe o ji n'aka-ya: ma o gosighi nna-ya, o gosighi kwa nne-ya, ihe o mere.


Ha we gwa ya okwu, si, É-è; kama ayi gēkesi gi ab͕u ike, nye gi n'aka-ha: ma ayi agaghi-eme ka i nwua ma-ọli. Ha we chiri udọ̀ ọhu abua ke ya ab͕u, me ka o si na nkume ahu di elu rigota.


Ndi Filistia we rigo, ma ulo-ikwū-ha nime Juda, b͕asa onwe-ha nime Lehi.


Delaila we chiri udọ̀ ọhu, were ha ke ya ab͕u, si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. Ma ndi nēche anwu nānọdu n'ime-ulo. O we dọbìpu ha n'ogwe - aka - ya abua dika ogho.


Ndi ahu we hu ya, to chi-ha: n'ihi na ha siri, Chi-ayi enyewo onye-iro-ayi n'aka-ayi, bú onye nēme ka ala-ayi tọb͕ọrọ n'efu, onye me-kwa-ra ka ndi-ayi eb͕uru eb͕u ba uba.


Ma o nwere ndi nēche anwu nānọdu n'ime-ulo. O we si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we dọbìe akwara asa ahu, dika anādọbì eriri-nzuzu mb͕e aṅara ya ọku. Amaghi kwa ike-ya.


Mọ nke Jehova we dikwasi ya, o we kpe Israel ikpe; ọ pua ibu agha, Jehova we nye Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia, n'aka-ya: aka-ya we di ike n'aru Kushan-rishataim.


Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata? Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n'isi n'isi; Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera, Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma, Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n'akuku abua, nke diri olu ndi akwatara?


Ha we biarue ebe ahu, rue ugwu ntà ahu, ma, le, usu ndi-amuma zutere ya; Mọ nke Chineke we dakwasi ya n'ike, o we bū amuma n'etiti ha.


Mọ nke Jehova gādakwasi gi n'ike, i gēsoro kwa ha bū amuma, i gāb͕anwe kwa ghọ nwoke ọzọ.


Mọ nke Chineke we dakwasi Sọl n'ike mb͕e ọ nuru okwu ndia, iwe-ya we di ọku nke-uku.


m'we pua so ya n'azu, tib͕ue ya, naputa nwa-aturu ahu n'ọnu-ya: o we bilie imegidem, m'we jide ya n'ọza-ya, tib͕ue ya, me ka ọ nwua.


O rue, mb͕e ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova batara n'ọmuma-ulo-ikwū, na Israel nile tiri oké nkpu, ala wee daa uda.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan