Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 14:6 - Bible Nso

6 Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we dọwa ya dika ọ gādọwa nwa-ewu, ma ọ dighi ihe o ji n'aka-ya: ma o gosighi nna-ya, o gosighi kwa nne-ya, ihe o mere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Nʼotu oge ahụ, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼike. O jekwuuru ọdụm ahụ, were aka ya abụọ dọwaa ya ọnụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwa ewu. Ma Samsin agwaghị nne na nna ya ihe mere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 14:6
21 Iomraidhean Croise  

Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu: I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri.


Ọ gaghi-eti nkpu, ọ gaghi-eweli kwa olu-ya elu, Ọ gaghi-eme kwa ka anu olu-ya n'èzí.


O we za, gwam okwu, si, Nka bu okwu Jehova nke Ọ gwara Zerubabel, si, Ọ bughi site n'usu-ndi-agha, ọ bughi kwa site n'ike, kama ọ bu site na Mọm, ka Jehova nke usu-ndi-agha siri.


Nyaranu yoke nkem n'olu-unu, muta-kwa-nu ihe n'ọnum; n'ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n'obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu.


ndi sitere n'okwukwe lub͕u ala-eze, lu ọlu ezi omume, nata nkwa di iche iche, kpuchita ọnu ọdum,


onye nēme nmehie si n'ekwensu puta; n'ihi na ekwensu nēmehie site na mbu. Ihe eji me ka Ọkpara Chineke puta ìhè bu nka, ka O we la ọlu nile nke ekwensu n'iyì.


Mọ nke Jehova we dikwasi Jefta, o we gabiga Gilead na Manase, gabiga kwa Mizpa Gilead, si na Mizpa nke Gilead gabiga rue umu Amon.


Mọ nke Jehova we malite ikwali obi-ya na Mahane-dan, n'etiti Zọra na Eshtaol.


Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we ridarue Ashkelon, tib͕ue orú ndikom na iri n'etiti ha, chiri ihe-ha ọ lutara, nye ndi gosiworo ilu ahu uwe nb͕anwe. Iwe-ya we di ọku, o we rigorue ulo nna-ya.


Samson we rida, ya na nna-ya na nne-ya, rue Timna, ha we biarue ubi-vine Timna: ma, le, nwa-ọdum tozuru etozu nāb͕ọ uja izute ya.


Ọ we rida, gwa nwanyi ahu okwu; o ziri ezi n'anya Samson.


O we huta ọkpukpu-àb͕à ọhu nke inyinya-ibu, setipu aka-ya, jide ya, were ya tib͕ue nnù ndikom abua na ọgu iri.


O we tib͕ue ha ntib͕u uku, ogwe-ukwu n'elu apata-ukwu: ọ we rida, nọdu nime nb͕awa nke nkume di elu, bú Itam.


Samson we si, Ka mu onwem soro ndi Filistia nwua. O we were ike rulata onwe-ya; ulo ahu we dakwasi ndi-isi ahu, dakwasi kwa ndi nile nọ nime ya. Ndi nwuru anwu ndi o mere ka ha nwua n'ọnwu-ya we di ọtutu kari ndi o mere ka ha nwua na ndu-ya.


Mọ nke Jehova we dikwasi ya, o we kpe Israel ikpe; ọ pua ibu agha, Jehova we nye Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia, n'aka-ya: aka-ya we di ike n'aru Kushan-rishataim.


Sọl we si nwa-nne nna-ya, O gosiri ayi nke-ọma na achọtawo nne-inyinya-ibu. Ma o gosighi ya okwu ala-eze ahu nke Samuel kwuru.


Mọ nke Jehova gādakwasi gi n'ike, i gēsoro kwa ha bū amuma, i gāb͕anwe kwa ghọ nwoke ọzọ.


Mọ nke Chineke we dakwasi Sọl n'ike mb͕e ọ nuru okwu ndia, iwe-ya we di ọku nke-uku.


Ubọchi we rue mb͕e Jonatan nwa Sọl siri nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, nke di n'ofè ọzọ ahu. Ma o gosighi nna-ya.


Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan