Ndị Ikpe 14:3 - Bible Nso3 Nna-ya na nne-ya we si ya, Ọ̀ dighi nwayi di n'etiti umu-ndinyom umu-nne-gi, ma-ọbu n'etiti ndim nile, na gi onwe-gi nēje iluru nwunye sitere na ndi Filistia, bú ndi anēbìghi úgwù? Samson we si nna-ya, Lutaram ya; n'ihi na ya onwe-ya ziri ezi n'anyam. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a3 Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?” Ma Samsin sịrị nna ya, “Gaa lụtara m ya. Nʼihi na o ziri ezi nʼanya m.” Faic an caibideil |