Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 14:19 - Bible Nso

19 Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we ridarue Ashkelon, tib͕ue orú ndikom na iri n'etiti ha, chiri ihe-ha ọ lutara, nye ndi gosiworo ilu ahu uwe nb͕anwe. Iwe-ya we di ọku, o we rigorue ulo nna-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya. O sitere nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼobodo Ashkelọn. Nʼebe ahụ ka ọ nọ tigbuo iri mmadụ atọ, napụ ha uwe ha niile, chịrị ha chịnye ndị ahụ kọwaara ya ilu ahụ. Ma site nʼoke iwe, o laghachiri nʼụlọ nna ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 14:19
9 Iomraidhean Croise  

Juda were kwa Geza na ókè-ala-ya, na Ashkelon na ókè-ala-ya, na Ekron na ókè-ala-ya.


Mọ nke Jehova we malite ikwali obi-ya na Mahane-dan, n'etiti Zọra na Eshtaol.


Ndikom obdo ahu we si ya n'ubọchi nke-asa tutu anyanwu ada, Gini di utọ kari manu-aṅu? ma-ọbu gini di ike kari ọdum? O we si ha, Ọ buru na unu ejighi nwa-ab͕ọghọ-ehim dọ ihe eji gwu ala-ubi, Unu agaghi-achọtawori ilum.


Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, o we dọwa ya dika ọ gādọwa nwa-ewu, ma ọ dighi ihe o ji n'aka-ya: ma o gosighi nna-ya, o gosighi kwa nne-ya, ihe o mere.


Mb͕e ya onwe-ya biaruru Lehi, ndi Filistia we tie nkpu n'izute ya: Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, udọ̀ abua nke di n'ogwe-aka-ya abua we di ka flax nke reworo n'ọku, ab͕u-ya nile we b͕azepu n'aka-ya abua.


Mọ nke Jehova we dikwasi ya, o we kpe Israel ikpe; ọ pua ibu agha, Jehova we nye Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia, n'aka-ya: aka-ya we di ike n'aru Kushan-rishataim.


Mọ nke Chineke we dakwasi Sọl n'ike mb͕e ọ nuru okwu ndia, iwe-ya we di ọku nke-uku.


Ndia bu emerod ọla-edo nke ndi Filistia nyeghachiri, ibu àjà-ikpe-ọmuma ichuru Jehova; Ashdod nwere otù, Geza nwere otù, Ashkelon nwere otù, Gat nwere otù, Ekron nwere otù;


Ha we si, Gini gābu àjà-ikpe-ọmuma ahu nke ayi gēnyeghachi Ya? Ha we si, Dika ọnu-ọgugu ndi-isi ndi Filistia si di, ọ bu emerod ọla-edo ise na òké ọla-edo ise ka unu gēnyeghachi: n'ihi na otù ihe-otiti diri ha nile, di-kwa-ra ndi-isi-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan