Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 14:12 - Bible Nso

12 Samson we si ha, Biko, ka m'luere unu ilu: ọ buru na unu egosim ya nke-ọma n'ubọchi asa nke oké oriri a, ọ buru na unu achọta ya, m'gēnye kwa unu orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mgbe ahụ, Samsin gwara ha okwu sị ha, “O nwere ajụjụ, gwa m, gwa m, gwa m, m chọrọ ka unu kọwaara m. Ọ bụrụ na unu enwee ike kọwaa ya, site taa ruo nʼụbọchị asaa nke mmemme a, aga m enye unu iri uwe mwụda atọ, nyekwa unu iri uwe mwụda atọ ọzọ akpara akpa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 14:12
22 Iomraidhean Croise  

Ha nile n'otù ka o nyere uwe-nb͕okwasi nb͕anwe; ma o nyere Benjamin ọgu nkpuru-ego ọla-ọcha iri na ọgu ise na uwe-nb͕okwasi nb͕anwe ise.


Eze-nwayi Sheba we nānu akukọ Solomon bayere aha Jehova, o we bia iwere ilu di iche iche nwa ya.


Ọ si, Udo di. Onye-nwem ezitewom, si, Le, ọbuná ub͕u a umu-okorọbia abua nime umu ndi-amuma esiwo n'ugwu Efraim biakutem; biko, nye ha otù talent ọla-ọcha, na uwe nb͕anwe abua.


Eze Siria we si, Je, ba, ka m'ziga-kwa-ra eze Israel akwukwọ. O we je, chiri n'aka-ya talent ọla-ọcha iri, na nnù ọla-edo iri-na-ise, na uwe nb͕anwe iri.


Solomon we me ememe na mb͕e ahu ubọchi asa, ya na Israel nile, oké nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt.


M'gātọ ntim n'ala n'ilu: M'gēkpughepu okwu-omimim n'ubọ-akwara.


Ighọta ilu, na okwu miri emi; Okwu nile nke ndi mara ihe, na okwu-omimi nile ha.


Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya; Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.


Nwa nke madu, tua otù ilu, tu-kwa-ra ulo Israel otù ilu;


M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ha nēkwu okwu bayerem, si, Ọ̀ bughi onye nātu ilu ilu ka ọ bu?


N'ihi nka ka M'nāgwa ha okwu n'ilu; n'ihi na ha adighi-ahu n'ọhuhu, ha adighi-anu kwa n'ọnunu, ha adighi-anuta kwa.


Okwu nile ndia ka Jisus gwara ìgwè madu nile n'ilu; ma O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu ọ bula:


Ha we yipu uwe-Ya, yikwasi Ya uwe uhie.


Unu akpadola àkù n'uwa nye onwe-unu, ebe nla na nchala nērichapu, ebe ndi-ori nēgwupú kwa nēzu kwa ori:


O we turu ndi akpọrọ ilu, mb͕e Ọ ribara ama otú ha nārọrọ isi ọnọdu; nāsi ha,


Ndi nēso uzọ-Ya si, Le, ub͕u a I nēkwuwa okwu, I dighi-atu kwa ilu.


N'ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m'mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m'gāmazu dika amazu-kwa-ram.


Àkù-unu erewo uré, uwe nile unu aghọwo kwa ihe nla ripiaworo.


O rue, mb͕e ha huru ya, na ha chitara orú eyì na iri ka ha nọyere ya.


ma ọ buru na unu apughi igosim ya, unu onwe-unu gēnyekwan orú uwe ákwà ọcha na iri na orú uwe nb͕anwe na iri. Ha we si ya, Lue ilu-gi, ka ayi we nu ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan