Umu Amon we hu na ha nēsì Devid ísì ọjọ, umu Amon we ziga, go Siria Bet-rehob na Siria Zoba, orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri ndi ji ukwu eje, na eze Meaka, ya na nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndikom Tob, bú orú nnù ndikom na nnù iri.
Ma ufọdu ndi jọb͕uru onwe-ha siri, Onye a, ò gēsi aṅa zọputa ayi? Ha we lelia ya, ha ewetaghi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma. O we di ka onye nti chiri.