Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 11:35 - Bible Nso

35 O rue, mb͕e ọ huru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ewó, adam! i mewo ka m'ruru ala nke-uku, gi onwe-gi adiwo kwa n'etiti ndi nēmekpam aru: ma mu onwem, asaghepuworom Jehova ọnum, apughkwam ilaghachi azu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 Mgbe Jefta hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya, tie mkpu sị, “Ewoo, nwa m nwanyị! I wetarala obi m ihe mgbu, nʼihi na ekwela m Onyenwe anyị nkwa, nke m na-aghaghị imezu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 11:35
19 Iomraidhean Croise  

Eze we ma jijiji nke-uku, rigo rue ulo-elu nke ọnu-uzọ-ama, kwa ákwá: ma otú a ka o siri mb͕e ọ nēje, Nwam Absalom, nwam, nwam Absalom! ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mu onwem anwuwo n'ọnọdu gi, Absalom, nwam, nwam!


Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tie aka n'obi n'iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu.


Job we bilie, dọwa uwe-nwuda-ya; kọpu isi-ya, da n'ala, kpọ isi ala;


Eledawo onye ajuru aju anya n'anya-ya, Ma ndi nātu egwu Jehova ka ọ nā-asọputu. Ọ ṅuwo iyi nke gēmejọ ya onwe-ya, ma ọ dighi-ab͕anwe okwu-ya.


M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi, M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi,


Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu, Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim.


Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune, bú ndi sitere na ndi nēledo ala ahu, we dọwa uwe-ha:


Ndi ahu we biakute ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye, si, Ayi ji anathema me onwe-ayi ka ayi buru anathema, na ayi agaghi-edetu ihe ọ bula ọnu rue mb͕e ayi gēb͕uwori Pọl.


Joshua we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, da kpue iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova rue anyasi, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel; ha we kpokwasi ájá n'isi-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan