Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 11:26 - Bible Nso

26 Mb͕e Israel biri na Heshbon na n'umu-obodo-ya, na n'Aroea na n'umu-obodo-ya, na n'obodo nile nke di n'akuku Anon, ọgu arọ iri-na-ise; gini mere unu anaputaghi kwa ha n'aka-ha na mb͕e ahu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Ọ bụ narị afọ atọ kemgbe ụmụ Izrel malitere ibi na Heshbọn na Aroea, na nʼime obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ruo nʼiyi Anọn. Ọ bụkwa gịnị mere na ịnapụtaghị ala ndị a nʼoge ndị ahụ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 11:26
21 Iomraidhean Croise  

Guzo n'uzọ, che nche, gi nwanyi bi n'Aroa: jua onye nāb͕alaga na nwanyi nke nēwepuga onwe-ya; si, Gini mere?


Mb͕e O wedasiri mba asa n'ala Kenean, O me ka ha keta ala-ha, ihe ra ka nnù arọ na ọgu arọ abua na iri:


Bilienu, bulie ije, gabiga ndagwurugwu Anon: le, enyewom Saihon onye-Amorait, bú eze Heshbon, na ala-ya, n'aka-gi: malite inweta ya, luso kwa ya ọ̀gù n'agha:


Site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo ahu nke di na ndagwurugwu ahu, we rue Gilead, ọ dighi obodo nke kariri ayi elu: ihe nile ka Jehova, bú Chineke-ayi, rara nye n'iru ayi:


Jehova we sim, Atula egwu ya: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon.


Ayi we wezuga ha ka ebibie ha, dika ayi mere Saihon, bú eze Heshbon, nēwezuga obodo, ndikom ọ bula, ya na ndinyom, na umu-ntakiri, ka ebibie ya.


Ọtutu ubọchi ka Joshua busoro eze ahu nile agha.


Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, nāchi kwa site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na etiti ndagwurugwu ahu, na nkera Gilead, we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;


nāchi kwa n'ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon.


na obodo nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, rue ókè-ala umu Amon;


Ókè-ala ha nwere we di site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke di n'akuku Medeba;


Heshbon, na obodo-ya nile nke di n'ala di lari; Dibon, na Bamot-beal, na Bet-beal-meon;


O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri site na mb͕e Jehova mere ka Israel zuru ike pua n'aka ndi-iro-ha nile buruburu, mb͕e Joshua ghọrọ agadi, mb͕e ubọchi ndu-ya nāgwu,


Ha we tipia, kpab͕u kwa umu Israel arọ ahu: arọ iri na asatọ ka ha kpab͕uru umu Israel nile ndi bi n'ofè Jọdan, n'ala ndi-Amorait, nke di na Gilead.


Ala ahu we di jū ọgu arọ abua. Ọtniel nwa Kenaz we nwua.


Ewe me ka Moab ruru ala n'okpuru aka Israel n'ubọchi ahu. Ala ahu we di jū ọgu arọ anọ.


Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova: Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya. Ala we di jū ọgu arọ abua.


Ewe me ka Midian ruru ala n'iru umu Israel, ha ewelighi kwa isi-ha ọzọ. Ala we di jū ọgu arọ abua n'ub͕ochi Gideon.


Abimelek we buru onye-isi Israel arọ atọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan