14 Jefta we zì kwa ndi-ozi jekuru eze umu Amon ọzọ:
14 Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn,
Mu onwem bu onye-udo: Ma mb͕e m'nēkwu okwu, ndi ahu nāchọ ibu agha.
Asi na ọ bu ihe gēkwe unu, ka ihe nke diri unu onwe-unu ra, unu na madu nile nādi n'udo.
Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya:
Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe; Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.
Eze umu Amon we si ndi-ozi Jefta, N'ihi na Israel were alam, mb͕e o si n'Ijipt rigota, site n'Anon we rue Jabok, ru kwa Jọdan: ma ub͕u a nyeghachi ala ahu nile n'udo.
ọ si ya, Otú a ka Jefta siri, Israel eweghi ala Moab ma-ọbu ala umu Amon: