Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Ikpe 10:10 - Bible Nso

10 Umu Israel we tikue Jehova, si, Ayi emehiewo megide Gi, ọbuná n'ihi na ayi arapuwo Chineke-ayi, we fè Bealim òfùfè.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Nʼikpeazụ, ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, rịọọ ya ka ọ gbapụta ha. Ha kwupụtara sị, “Anyị emehiela megide gị, anyị ahapụla gị Chineke anyị, fee arụsị Baal ofufe.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Ikpe 10:10
11 Iomraidhean Croise  

Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile.


Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we zọputa ha na nkpà-ha nile.


Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, Ọ we me ka ha puta na nkpà-ha nile.


ndi nāsi osisi, Nnam ka i bu; nāsi kwa nkume, Gi onwe-gi murum: n'ihi na ha ab͕akutawom azu, ha echeghm iru: ma na mb͕e ọnọdu ọjọ ha ha gasi, Bilie, we zọputa ayi.


Umu Amon we gabiga Jọdan ibuso kwa Juda, na ibuso Benjamin, na ibuso ulo Efraim, agha; ewe kpab͕ue Israel nke-uku.


Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere umu Israel, ọ we zọputa ha, bú Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne ntà Keleb.


Umu Israel we tikue Jehova: n'ihi na o nwere nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise; ya onwe-ya we meb͕usie umu Israel ike orú arọ.


Ewe me ka Israel ghara inwe ike ma ọli n'ihi Midian; umu Israel we tikue Jehova.


Ha we tikue Jehova nkpu, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi arapuwo Jehova, we fè Bealim na Ashtarot òfùfè: ma ub͕u a naputa ayi n'aka ndi-iro-ayi, ayi gēfè kwa Gi òfùfè.


Ha we chikọta onwe-ha rue Mizpa, sere miri, wusi ya n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu, kwue n'ebe ahu, si, Ayi emehiewo megide Jehova. Samuel we kpe umu Israel ikpe na Mizpa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan