Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 9:9 - Bible Nso

9 bú ulo-ikwū nke bu ulọ aturu oge nke di ub͕u a; anēche kwa ma onyinye ma àjà n'iru Chineke dika ulo-ikwū ahu si di, bú ihe nāpughi ime onye nēkpe ekpere ka o zu okè n'akuku akọ-na-uche,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nke a bụ ihe ilu banyere oge ugbu a. Site na nhazi nke a, onyinye na aja niile a na-achụ enweghị ike ime ka akọnuche onye na-efe ofufe zuo oke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 9:9
16 Iomraidhean Croise  

Otú ọ di, ọnwu si n'oge Adam buru eze rue oge Moses, ọbuná ichiri ndi nēmehieghi n'oyiyi nke njehie Adam, onye bu ihe-atù nke Onye ahu gaje ibia.


Ya mere, ìwu ahu nēmegide nkwa Chineke? Chineke ekwela: n'ihi na asi na enyereri iwu nke puru ime ka adi ndu, n'ezie ezi omume gēsitewori n'iwu.


Onye-nchu-àjà ọ bula nēguzo kwa kwa-ubọchi nēfè òfùfè nēche kwa otù àjà ndia n'iru Chineke ọtutu mb͕e, bú àjà nke nāpughi ihichapu nmehie mb͕e ọ bula:


ebe ọ nāgu na Chineke puru ime ka o si ọbuná na ndi nwuru anwu bilie; nke ọ naghachi-kwa-ra ya site n'ebe ahu nime ilu.


N'ihi na onye-isi-nchu-àjà ọ bula, esi n'etiti madu weputa ya, ọ bu n'ihi madu ka anēdo ya onye-isi-nchu-àjà n'ihe diri Chineke, ka o we nēche onyinye na àjà di iche iche n'ihi nmehie n'iru Chineke:


Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n'ihi na ndi Israel anatawo iwu n'okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di?


Ya mere ọ buru na Ọ nọ n'uwa, Ọ gaghi-abu onye-nchu-àjà ma-ọli, ebe ndi nēche onyinye ahu nile n'iru Chineke dika iwu si di nọ:


N'ihi na Kraist abàghi n'ebe nsọ eji aka me, bú ihe-atù yiri ebe nke bu ebe nsọ n'ezie; kama Ọ bàra n'elu-igwe onwe-ya, igosi Onwe-ya n'iru Chineke n'ihi ayi ub͕u a:


bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n'uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, site na nbilite-n'ọnwu nke Jisus Kraist;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan