Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 9:6 - Bible Nso

6 Ma ebe edoziworo ihe ndia otú a, ndi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū mbu mb͕e nile, nēkpezu ekpere nile ha;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 9:6
9 Iomraidhean Croise  

N'ulo-ikwū nzute, bú n'èzí ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ihe-àmà, ka Eron na umu-ya ndikom gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova: ọ gābu ukpuru mb͕e ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile site n'umu Israel.


Ọbuná rue Onye-isi nke usu ahu ka o mere onwe-ya uku;ọ bu kwa n'aka-Ya ka ọ napuru àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, atuba-kwa-ra ọnọdu nke ebe nsọ Ya.


Ọzọ kwa, umu-nne-gi, bú ebo Livai, ebo nna-gi, gi me ka ha soro gi biaru nso, ka ha we rapara n'aru-gi, nēje-kwa-ra gi ozi: ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gānọ n'iru ulo-ikwū ihe àmàm.


I gāsi kwa ha, Nka bu àjà-ọku nke unu gēweta nso Jehova; umu-aturu abua nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè, kwa-ubọchi, ibu àjà-nsure-oku anēsure mb͕e dum.


ebe ha bu ndi Israel; ndi nwe ido-ka-nwa-nwoke ahu, na ebube ahu, na ọb͕ub͕a-ndu nile, na inye-iwu ahu, na ikpe ekpere ahu n'ulo uku Chineke, na nkwa nile;


Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n'ihi na ndi Israel anatawo iwu n'okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan