Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 9:2 - Bible Nso

2 N'ihi na edoziri ulo-ikwū, ulo mbu, nke ihe-idọba-oriọna ahu, na table ahu, na ob͕e achicha ahu anēche n'iru Chineke di nime ya; nke anākpọ Ebe Nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 9:2
21 Iomraidhean Croise  

I gēme kwa table osisi acacia: cubit abua ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.


I gādọba kwa achicha nke iru Chineke n'elu table ahu n'irum mb͕e dum.


I gēme kwa ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka agēme ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya, na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, gēsite na ya:


Ebe-obibim ka i gēme kwa: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu onye-ọ̀kà, ihe ndia ka i gēji me ha.


I gētiye kwa ákwà-nb͕ochi ahu n'okpuru nko ahu, i gēbubata kwa n'ebe ahu nime ákwà-nb͕ochi ahu ib͕e ihe-àmà ahu: ákwà-nb͕ochi ahu gākpa-kwa-ra unu ókè n'etiti ebe nsọ ahu na ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.


I gādọba table ahu n'èzí ákwà-nb͕ochi ahu, na ihe-idọba-oriọna ahu na ncherita-iru table n'akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida: ma table ka i gētiye n'akuku Ugwu.


Nka bu kwa ihe i gēme ha ido ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: were otù nwa-oke-ehi na ebulu abua nke zuru okè,


I gēme kwa Eron, me kwa umu-ya ndikom, otú a, dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu: ubọchi asa ka i gēmeju aka-ha.


N'ubọchi mbu nke ọnwa mbu ka i gēguzo ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute ahu ọtọ.


I gēwebata kwa table ahu, do ihe ya n'usoro; i gēwe-bata kwa ihe-idọba-oriọna ahu, weli kwa oriọna-ya nile.


otú ọ batara n'ulo Chineke, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka o rie, ma-ọbu ndi so ya, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi?


Ma ha adighi-amuye oriọna, dọba ya n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna; ọ nēnwu-kwa-ra madu nile nọ n'ulo ahu.


ọ bughi kwa ka O we nēche Onwe-ya n'iru Chineke ọtutu mb͕e; dika onye-isi-nchu-àjà nēwere ọbara nābughi nke ya nābà n'ebe nsọ kwa-arọ;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan