Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ndị Hibru 8:12 - Bible Nso

12 N'ihi na M'gēmere ajọ omume nile ha ebere, M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha ọzọ ma-ọli.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ndị Hibru 8:12
17 Iomraidhean Croise  

Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile: Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam, N'ihi idi-nma-Gi, Jehova.


Okwu nile nke ajọ omume nile dikaririm ike: Njehie nile ayi, Gi onwe-gi gēkpuchi ha.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.


Ehichapuwom njehie-gi nile, dika oké igwe-oji, hichapu kwa nmehie-gi nile, dika igwe-oji: Iaghachikutem; n'ihi na ab͕aputawom i.


ha agaghi-eme kwa onwe-ha ka ha muta ọzọ, onye ọ bula o me ka onye-ab͕ata-obi-ya muta, onye ọ bula o me kwa ka nwa-nne-ya muta, si, Maranu Jehova: n'ihi na ha nile gāmara Mu onwem, site n'onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gāb͕aghara ajọ omume-ha, M'gaghi-echeta kwa nmehie-ha ọzọ.


M'gēme kwa ka ha si n'ajọ omume nile ha, bú nke ha mehieworo megidem, di ọcha; M'gāb͕aghara kwa ha ajọ omume-ha nile nke ha mehieworo megidem, na nke ha jehieworo megidem n'ime ha.


N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), agāchọ ajọ omume Israel, ma ọ gaghi-adi; agāchọ kwa nmehie nile nke Juda, ma agaghi-achọta kwa ha: n'ihi na M'gāb͕aghara ndi M'nēme ka ha fọdu nmehie-ha.


Ònye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru? O jigideghi iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu.


Ọ gēchighari, nwe obi-ebere n'aru ayi; Ọ gāzọda ajọ omume nile ayi: I gātubà kwa nmehie nile ha n'ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri.


Nka bu kwa ọb͕ub͕a-ndu gādiri ha site n'ebe M'nọ, Mb͕e ọ bula M'gēwepu nmehie nile ha.


Onye ayi sitere n'ọbara-Ya nwe nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nke ndahie nile ayi, dika àkù nke amara-Ya si di,


Onye ayi nwere nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nmehie nile ayi:


nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan